isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 14 Bible Nso (IGBOB)

1. Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà na nkume, na ndi-ọ̀kà n'osisi, iwuru Devid ulo.

2. Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n'ihi na ebuliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.

3. Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ.

4. Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;

5. na Ibha, na Elishua, na Elpelet;

6. na Noga, na Nefeg, na Jafia;

7. na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.

8. Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha.

9. Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim.

10. Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi.

11. Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n'akam, dika nkwopú miri. N'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

12. Ha we rapu chi nile ha n'ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n'ọku.

13. Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu.

14. Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n'ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.

15. Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n'ihi na Chineke apuwo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.

16. Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea.

17. Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.