isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi Filistia busoro Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.

2. Ndi Filistia we sosie ike n'azu Sọl na n'azu umu-ya ndikom; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.

3. Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya; o we nēb͕u ya nb͕u site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.

4. Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa nma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.

5. Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, nwua.

6. Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ; ulo-ya nile nwu-kwa-ra n'otù.

7. Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.

8. O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biaru ibupu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl ma umu-ya ndikom ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.

9. Ha we yipu ihe-agha-ya, būru isi-ya na ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisara arusi nile ha na ndi-ha ozi ahu.

10. Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo chi-ha, kpọgide okpokoro-isi-ya n'ulo Degon.

11. Jebesh-gilead nile we nu ihe nile ndi Filistia mere Sọl,

12. ndikom nile bu dìnkpà we bilie, būru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom, bubata ha na Jebesh, lìe ọkpukpu-ha n'okpuru osisi terebinth nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.

13. Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,

14. ma ọ jughi Jehova ase: O we me ka ọ nwua, O we chigharia ala-eze nye Devid nwa Jesi.