isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 27 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e onye ọ bula gēmezu nkwa, dika okwu si di ka madu nile gāburu Jehova.

3. Ọgugu ọnu gi gābu kwa nke nwoke site n'onye b͕ara orú arọ we rue onye b͕ara ọgu aro atọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa ọgu shekel ọla ọcha abua na iri, dika shekel nke ebe nsọm si di.

4. Ma ọ buru na nwayi ka ọ bu, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa orú shekel na iri.

5. Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara arọ ise we rue onye b͕ara orú arọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa orú shekel, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.

6. Ma ọ buru na ọ bu site n'onye ruru otù ọnwa we rue onye b͕ara arọ ise, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa shekel ọla-ọcha ise, ma shekel ọla-ọcha atọ ka ọ̀rùrù-ọnu-gi gāburu nwayi.

7. Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara ọgu arọ atọ we gaba n'iru; ọ buru na ọ bu nwoke, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa shekel iri na ise, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.

8. Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n'iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu.

9. Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo, nke madu nēsite na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ihe ọ bula madu gēsite na ya nye Jehova gādi nsọ.

10. Ọ gaghāb͕anwe ya, ọ gaghi-enwo kwa ya, ezi ihe n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe: ma ọ buru na o were anu-ulo nwo anu-ulo ma-ọli nke ahu di kwa nsọ, ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ.

11. Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo ọ bula ruru árú, nke ha nēsiteghi na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ọ gēme kwa ka anu-ulo ahu guzo n'iru onye-nchu-àjà:

12. onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ: dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, gi onye-nchu-àjà, otú a ka ọ gādi.

13. Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise ya n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.

14. Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo.

15. Ọ buru kwa na onye ahu nke nēdo ya nsọ ab͕aputa ulo-ya, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, ọ gābu kwa nke ya.

16. Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n'ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri.

17. Ọ buru na o sitere n'arọ jubile do ala-ubi-ya nsọ, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di ka o gēguzo.

18. Ma ọ buru na o do ala-ubi-ya nsọ mb͕e jubile gasiri, onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ego-ya dika arọ fọduru iru arọ jubile si di, agāgubì kwa ihe n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.

19. Ma ọ buru na onye ahu nke nēdo ala-ubi nsọ ab͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzọ ise nke ego ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēme kwa ka o guzosiere ya ike.

20. Ma ọ buru na ọ b͕aputaghi ala-ubi ahu, ma-ọbu na ọ renyewo onye ọzọ ala-ubi ahu, agaghi-ab͕aputa ya ọzọ:

21. ma ala-ubi ahu, n'òpùpù-ya nime jubile, gādiri Jehova nsọ, dika ala-ubi nke ewezugara ka ebibie ya; onye-nchu-àjà gēnwe ihe-onwunwe ala-ubi ahu.

22. Ma ọ buru na o doro Jehova ala-ubi ọ zuworo nsọ, bú nke nēsiteghi n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya;

23. onye-nchu-àjà gāgu-kwa-ra ya ọgugu nke ọ̀rùrù-ọnu-gi rue arọ jubile: ọ gēnye kwa ọ̀rùrù-ọnu-gi n'ubọchi ahu, dika ihe nsọ diri Jehova.

24. N'arọ jubile ala-ubi ahu gālaghachiri onye azutara ya n'aka-ya, bú onye nwe ihe-onwunwe nke ala ahu.

25. Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu.

26. Nání nwa eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo, nke anēme ka ọ buru nwa eburu uzọ muru Jehova, ọ dighi onye ọ bula gēdo ya nsọ: ma ọ bu ehi ma-ọbu aturu, ihe Jehova nwere ka ọ bu.

27. Ma ọ buru na ọ di n'etiti anu-ulo ruru árú, ọ gāb͕aputa kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ọ gātukwasi kwa ya otù uzọ n'uzo ise ya: ma ọ buru na ab͕aputaghi ya, agēre kwa ya dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di.

28. Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n'ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova.

29. Ọ dighi onye ọ bula agāb͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke agēwezuga ka ebibie ya site n'etiti madu: aghaghi ime ka ọ nwua.

30. Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova.

31. Ma ọ buru na onye ọ bula ab͕aputa ihe nime otù uzọ n'uzọ iri ihe-ya ma-ọli, otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya.

32. Otù uzọ kwa n'uzọ iri nke ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu nile, ihe ọ bula nke nāgabiga n'okpuru nkpa-n'aka, otù uzọ n'uzọ iri gābu ihe nsọ diri Jehova.

33. Ọ gaghi-etucha n'etiti ezi anumanu na anumanu ọjọ ọ gaghi-enwo kwa ya: ma ọ buru na o nwo ya ma-ọli, nke ahu di kwa nsọ ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ; agaghi-agbnwe ya.

34. Ndia bu ihe enyere n'iwu, nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere umu Israel n'ugwu Sainai.