1. Jehova we gwa Moses okwu, mb͕e umu-ndikom abua nke Eron nwusiri, mb͕e ha biaruru nso n'iru Jehova, we nwua;
2. Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.
3. Nka ka Eron gēwere bata n'ebe nsọ a: ọ gēwere nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nmehie, na ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku.
4. Uwe-ime di nsọ nke ákwà ọcha ka o gēyiri, uwe-ukwu nke ákwà ọcha gādikwasi kwa n'anu-aru-ya, agēwere kwa ihe ike n'úkwù nke ákwà ọcha ke ya, akwa nkechi nke ákwà ọcha ka agēkpukwasi kwa ya: uwe nsọ ka ha bu; ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya, we yiri ha.
5. N'aka nzukọ umu Israel ka ọ gānara kwa nkpi abua ka ha buru àjà-nmehie, na otù ebulu ka ọ buru àjà-nsure-ọku.
6. Eron gēweta kwa nso oké-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, ọ gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha.
7. Ọ gēwere kwa nkpi abua ahu, guzo ha n'iru Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
8. Eron gēfe kwa nzà n'elu nkpi abua ahu; otù nzà diri Jehova, otù nzà di-kwa-ra ewu-ọpupu.
9. Eron gēweta kwa nso nkpi ahu nke nzà nke diri Jehova mara, ọ gēme kwa ya ka ọ buru àjà-nmehie.
10. Ma nkpi ahu, nke nzà nke diri ewu-ọpupu mara, agēguzo ya na ndu n'iru Jehova, ikpuchi nmehie n'elu ya, izilaga ya n'ọzara ka ọ buru ewu-ọpupu.
11. Eron gēweta kwa nso oke-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, o gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha, o gēb͕u kwa oke-ehi àjà-nmehie ahu nke diri ya onwe-ya:
12. ọ gēwere kwa ihe-igu-ọku juputara n'icheku-ọku site n'elu ebe-ichu-àjà, site n'iru Jehova, na nju aka-ya abua nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke eji uda utọ di iche iche me, bú nke esupiara esupia, ọ gēwebata ya nime ákwà-nb͕ochi:
13. ọ gētiye kwa ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ n'elu ọku n'iru Jehova, ka anwuru-ọku nke ihe-nsure-ọku ahu nke nēsi ísì utọ we kpuchie ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ka ọ we ghara inwu:
14. ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, were nkpisi-aka-ya fesa ya n'iru ebe-nkpuchi-nmehie chere iru n'Iru-anyanwu; ọ bu kwa n'iru ebe-nkpuchi-nmehie ahu ka ọ gēwere nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa.
15. Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie:
16. ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha.
17. Ọ dighi kwa madu ọ bula gānọ n'ulo-ikwū nzute mb͕e ọ nābà ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, rue mb͕e ọ putara, kpuchisi-kwa-ra onwe-ya, kpuchisi-kwa-ra ulo-ya, kpuchisi-kwa-ra nkpọkọta nile nke Israel, nmehie-ha.
18. Ọ gāpu kwa je n'ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; were kwa ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, na ufọdu nime ọbara nkpi ahu, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà buruburu.
19. Ọ gēwere kwa nkpisi-aka-ya fesa ufọdu nime ọbara ahu n'elu ya ub͕ò asa, me ya ka ọ di ọcha, do kwa ya nsọ site n'ọrurú nile nke umu Israel.
20. Mb͕e o kpuchibiri nmehie ebe nsọ a, na nke ulo-ikwū nzute, na nke ebe-ichu-àjà, ọ gēweta nso nkpi ahu di ndu:
21. Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere:
22. nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara.
23. Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu:
24. ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.
25. Abuba àjà-nmehie ahu, o gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà.
26. Onye nēzilaga nkpi ka ọ buru ewu-ọpupu gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
27. Oke-ehi àjà-nmehie ahu kwa, na nkpi àjà-nmehie ahu, nke ewebatara ọbara-ha ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, agēbupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ha gēsure kwa akpukpọ-ha na anu-ha na nsi-ha nime ọku.
28. Onye nēsure ha ọku gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa anu-aru-ya, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū.
29. Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n'ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:
30. n'ihi na n'ubọchi a ka agēkpuchiri unu nmehie-unu, ime ka unu di ọcha; site na nmehie nile unu ka unu gādi ọcha n'iru Jehova.
31. Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ buru unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala: ọ bu ukpuru ebighi-ebi.
32. Onye-nchu-àjà ahu, nke agēte manu, nke agēmeju kwa aka-ya ibu onye-nchu-àjà n'ọnọdu nna-ya, ọ gēkpuchi nmehie, yiri kwa uwe ákwà ọcha ahu, bú uwe nsọ ahu:
33. o gēkpuchi kwa nmehie nke ebe nsọ a di nsọ, nmehie ulo-ikwū nzute na nke ebe-ichu-aja ka ọ gēkpuchi kwa: ọ gēkpuchi-kwa-ra ndi-nchu-àjà, kpuchi-kwa-ra ndi nile nke nkpọkọta a, nmehie-ha.