isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 20 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n'etiti umu Israel, ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya.

3. Mu onwem gēche kwa irum megide nwoke ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya; n'ihi na ufọdu nime nkpuru-ya ka o nyeworo Molek, ka o we meru ebe nsọm, na ime ka aha nsọm ghara idi nsọ.

4. Ma ọ buru na ndi ala-unu ezopu anya-ha n'aru nwoke ahu ma-ọli, mb͕e ọ nēnye Molek ufọdu nime nkpuru-ya, ha we ghara ime ka ọ nwua:

5. Mu onwem gēdo kwa irum megide nwoke ahu, megide kwa ab͕uru-ya, Mu onwem gēbipu kwa ya ndi-nile nēso ya kwa iko, bú iso Molek kwa iko, n'etiti ndi-ha.

6. Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya.

7. Unu gēdo kwa onwe-unu nsọ we di nsọ; n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

8. Unu gēdebe ukpurum nile, me ha: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ.

9. N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.

10. Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.

11. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nna-ya nēdina, ọtọ nna-ya ka o kpugheworo: aghaghi ime ka ha abua nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

12. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-ya nēdina, aghaghi ime ka ha abua nwua: ngwakọta ọjọ ka ha meworo; ọbara-ha gādikwasi ha.

13. Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

14. Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n'ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n'etiti unu.

15. Nwoke ọ bula nke ya na anumanu nēdina ka ọ ra aru n'aru-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: unu gēb͕u kwa anumanu ahu.

16. Nwayi ọ bula nke nābiaru nso anumanu ọ bula, iso ya dina, i gēb͕u nwayi ahu na anumanu ahu: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.

17. Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.

18. Nwoke ọ bula nke ya na nwayi nke nāsọ uba nēdina, nke gēkpughe kwa ọtọ-ya; isi ọbara nwayi ahu ka ọ b͕abaworo ọtọ, nwayi ahu ekpughewo kwa isi ọbara nke ya onwe-ya: agēbipu kwa ha abua n'etiti ndi-ya.

19. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwayi nke nne-gi, ma-ọbu ọtọ nke nwa-nne-nwayi nke nna-gi: n'ihi na onye-aru-ya ka ọ b͕abaworo ọtọ: ha gēbu ajọ omume-ha.

20. Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-nne nke nna-ya nēdina, ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-ya ka o kpugheworo: nmehie-ha ka ha gēbu; ha gāb͕a aka nwa nwua.

21. Nwoke ọ bula nke nēkuru nwunye nwa-nne-ya, ihe isọ nsọ ka ọ bu: ọtọ nwa-nne-ya nwoke ka o kpugheworo; ha gāb͕a aka nwa.

22. Unu gēdebe kwa ukpurum nile, na ikpém nile, me ha: ka ọ we ghara ibọputa unu, bú ala ahu nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu ibi nime ya.

23. Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.

24. Ma asim unu, Unu onwe-unu gēnweta ala-ha, Mu onwem gēnyekwara unu aka inweta ya, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke kpaworo ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ.

25. Unu gākpa kwa ókè n'etiti anumanu di ọcha na nke ruru árú, na n'etiti anu-ufe ruru árú na nke di ọcha: unu ewe-kwa-la anumanu me onwe-unu ihe-árú, ewe-kwa-la anu-ufe, ewe-kwa-la ihe ọ bula nākpu akpu n'ala, nke M'kpaworo ókè n'etiti unu na ya, ime ka ọ rua árú.

26. Unu gābu-kwa-ram ndi nsọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, akpawokwam ókè n'etiti unu na ndi nile ọzọ ka unu we buru nkem.