isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we kpọ Moses òkù, si n'ulo-ikwū nzute gwa ya okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n'etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n'etiti anu-ulo, n'etiti ìgwè ehi na n'etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso.

3. Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova

4. O gēbikwasi aka-ya n'isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n'ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya.

5. Ọ gēb͕u kwa nwa-ehi ahu n'iru Jehova: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēweta ọbara-ya nso, wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu, bú nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

6. Ọ gāb͕a kwa ehi àjà-nsure-ọku ahu akpukpọ, bọ ya n'ọbubọ-ya.

7. Umu-ndikom Eron, bú onye-nchu-àjà, gētiye ọku n'elu ebe-ichu-àjà, do nkú n'usoro n'elu ọku:

8. umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēdo anu ahu abọrọ abọ̀, na isi-ya, na abuba-ya, n'usoro n'elu nkú nke di n'elu ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà:

9. ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

10. Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso sitere n'ìgwè ewu na aturu, site n'aturu, ma-ọbu site n'ewu, bú nke ọ nēweta nso ibu àjà-nsure-ọku; oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso.

11. Ọ gēb͕u kwa ya n'iru Jehova n'akuku ebe-ichu-àjà chere iru n'Ugwu: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.

12. Ọ gābọ kwa ya n'ọbubọ-ya nile, ya na isi-ya na abuba-ya: onye-nchu-àjà gēdo kwa ha n'usoro n'elu nkú nke di n'elu ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà:

13. ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

14. Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso Jehova bu àjà-nsure-ọku sitere n'anu-ufe, o gēsi n'etiti nduru ma-ọbu n'etiti umu-kpalakwukwu weta nso onyinye-ya iji biaru nso.

15. Onye-nchu-àjà gēweta ya nso ebe-ichu-aja, gbupu isi ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; agāpipu kwa ọbara-ya n'akuku ebe-ichu-àjà:

16. ọ gēwezuga kwa àkpà-nri-ya na ihe di nime ya, tufu na nso ebe-ichu-àjà n'akuku Iru-anyanwu, n'ebe ntú:

17. ọ gāb͕ọwa kwa ya na nkù-ya abua, ma ọ gaghi-ekewa ya: onye-nchu-àjà gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, n'elu nkú nke di n'elu ọku: àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.