isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 12 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si, Nwayi, mb͕e ọ gātu ime, mua nwa-nwoke, ọ gāru kwa árú ubọchi asa; dika ubọchi idi-na-nsọ nke isọ-uba-ya si di, otú a ka ọ gāru árú.

3. N'ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n'anu-aru nke api-ya.

4. Orú ubọchi na iri na atọ ka nwayi ahu gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha; ọ dighi ihe nsọ ọ bula ọ gēmetu aka, ọ gaghi-abà kwa n'ebe nsọ ahu, rue ozùzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha.

5. Ma ọ buru na ọ mua nwa-nwayi, ọ gāru kwa árú ízù ubọchi asa abua, dika n'idi-na-nsọ-ya; ọ bu kwa ọgu ubọchi atọ na isi ka ọ gānọgide n'ọbara nke ime ya ka ọ di ọcha

6. N'ozuzù ubọchi nile nke ime ya ka ọ di ọcha bayere nwa-nwoke, ma-ọbu bayere nwa-nwayi, ọ gēwetara onye-nchu-àjà nwa-aturu nke b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na nwa-kpalakwu-kwu, ma-ọbu nduru, ka ọ buru àjà-nmehie, rue ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute:

7. ọ gēweta kwa ya nso n'iru Jehova, kpuchiere ya nmehie-ya; agēme kwa ya ka ọ di ọcha site n'isi ọbara-ya. Nka bu iwu nke nwayi nke nāmu nwa, ma ọ bu nwoke ma-ọbu nwayi.