isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 18 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

3. Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.

4. Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

5. Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.

6. Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova.

7. Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.

8. Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu.

9. Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.

10. Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu.

11. Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya.

12. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nna-gi: onye-aru nna-gi ka ọ bu.

13. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nne-gi: n'ihi na onye-aru nne-gi ka ọ bu.

14. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-gi, abiarula nwunye-ya nso: nwunye nwa-nne nna-gi ka ọ bu.

15. Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: nwunye nwa-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.

16. Ekpughela ọtọ nwunye nwa-nne-gi: ọtọ nwa-nne-gi ka ọ bu.

17. Ekpughela ọtọ nwanyi na nwa ya nwanyi; ekurula nwa-nwanyi nke nwa-ya nwoke, ma-ọbu nwa-nwayi nke nwa ya nwanyi, ikpughe ọtọ-ya; ndi-aru ka ha bu: nzube ọjọ ka ọ bu.

18. Ekuru-kwa-la nwayi tiyere nwa-nne-ya nwayi, ikpab͕u ya, ikpughe ọtọ-ya, tiyere ya na ndu-ya.

19. Abiarula nso nwayi ikpughe ọtọ-ya n'idi-na-nsọ nke ọrurú-ya.

20. Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi.

21. Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

22. Gi na nwoke edinala dika nwoke na nwayi nēdina ihe-árú ka ọ bu.

23. Gi na anumanu ọ bula edina-kwa-la ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi: nwayi agaghi-eguzo kwa n'iru anumanu iso ya dina; ngwakọta ọjọ ka ọ bu.

24. Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu:

25. ala ahu ru-kwa-ra árú: M'nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya.

26. Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:

27. (n'ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n'iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú;)

28. ka ala ahu we ghara ib͕ọputa unu mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕ọputara mba ahu nke di n'iru unu.

29. N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile, agēbipu nkpuru-obi nile nēme ha n'etiti ndi-ha.