isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 4 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha:

3. ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.

4. Ọ gēme ka oke-ehi ahu biarute ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova; ọ gēbikwasi aka-ya n'isi oke-ehi ahu, b͕u kwa oké-ehi ahu n'iru Jehova.

5. Onye-nchu-àjà etere manu gēwere ufọdu nime ọbara oké-ehi, webata ya n'ulo-ikwū nzute:

6. onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu.

7. Onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me n'iru Jehova, nke di nime ulo-ikwū nzute; ọ bu kwa ọbara nile nke oke-ehi ahu ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

8. Ọ gēsi kwa nime ya welie abuba nile nke oke-ehi nke àjà-nmehie; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime,

9. na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya),

10. dika esi n'oké-ehi nke ihe àjà nke àjà-udo eweli ya: onye-nchu-àjà gēsure kwa ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

11. Ma akpukpọ oke-ehi ahu, na anu-ya nile, tiyere isi-ya, tiye kwa ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, na ihe-ime-ya, na nsi-ya,

12. ọbuná oke-ehi ahu nile ka o gēbupu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū rue ebe di ọcha, rue ikpo-ntu, sure ya n'elu nkú n'ọku: n'elu ikpo-ntu ka agēsure ya ọku.

13. Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha;

14. mb͕e amara nmehie nke ha mehieworo nime ya, nkpọkọta Israel ahu gēweta kwa nso nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie, ha gēme kwa ka ọ bia n'iru ulo-ikwū nzute.

15. Ndi-okenye nzukọ ahu gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu n'iru Jehova: agēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova.

16. Onye-nchu-aja etere manu gēwebata ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu n'ulo-ikwū nzute:

17. onye-nchu-aja gēdeye nkpisi-aka-ya nime ọbara ahu, fesa ya ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru akwa-nb͕ochi ahu.

18. Ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke di n'iru Jehova, nke di nime-ulo-ikwū nzute, ọ bu kwa ọbara nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

19. O gēsi kwa nime ya welie abuba-ya nile, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja.

20. Ọ gēme kwa oke-ehi ahu dika ọ mere oke-ehi nke àjà-nmehie, otú a ka ọ gēme ya: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha ya.

21. O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu.

22. Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n'amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

23. ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo nime ya, ọ gēweta nkpi, bú oké zuru okè, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso;

24. o gēbikwasi aka-ya n'isi nkpi ahu, b͕u kwa ya n'ebe anēb͕u anu àjà-nsure-ọku n'iru Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

25. Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku.

26. Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

27. Ma ọ buru na otù madu n'etiti ndi ala emehie n'amaghi-ama, n'ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

28. ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo, ọ gēweta kwa ewu, bú nne zuru okè, bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso.

29. Ọ gēbi-kwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n'ebe àjà-nsure-ọku.

30. Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.

31. Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n'elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

32. Ma ọ buru na ọ weta nwa-aturu dika onyinye-ya iji biaru nso ka ọ buru àjà-nmchie, nne zuru okè ka ọ gēweta ya.

33. O gēbikwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ya ibu àjà-nmehie n'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku.

34. Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà:

35. abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika anēwezuga abuba nwa-aturu n'ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.