isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 15 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,

2. Gwanu umu Israel okwu, si ha, Nwoke ọ bula, mb͕e orùrù di sitere n'anu-aru-ya, n'ihi orùrù-ya onye ruru árú ka ọ bu.

3. Nka gābu kwa ọrurú n'orùrù-ya: ma ọ bu na anu-aru-ya nērù n'orùrù-ya, ma ọ bu na eb͕ochiwo anu-aru-ya n'orùrù-ya, orurú-ya ka ọ bu.

4. Ihe-ndina ọ bula nke onye nwere orùrù ahu nēdinakwasi gāru árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.

5. Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

6. Onye nānọkwasi n'ihe nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

7. Onye nēmetu anu-aru nke onye ahu nwere orùrù gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

8. Ọzọ, mb͕e onye nwere orùrù gābusa onye di ọcha ọnu-miri: ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

9. Ihe ọ bula eji anọkwasi anumanu nke onye nwere orùrù nānọkwasi gāru kwa árú.

10. Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula di n'okpuru ya aru gāru árú rue anyasi: onye nēbu kwa ha gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

11. Onye ọ bula nke onye nwere orùrù nēmetu aka, mb͕e ọ nāṅachaghi aka-ya abua na miri, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

12. Ihe ájá kwa, nke onye nwere orùrù nēmetu aru, agētiwa ya: ihe osisi ọ bula kwa, agāṅacha ya na miri.

13. Ma mb͕e emeworo onye nwere orùrù ka ọ di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa ime ka ọ di ọcha, ọ gāsu kwa uwe-ya nile: ọ gāsa kwa anu-aru-ya nime miri nērù erù, ọ gādi kwa ọcha.

14. Ma n'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, bia n'iru Jehova rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, nye ha onye-nchu-àjà:

15. onye-nchu-àjà gēme kwa ha, otù ka ọ buru àjà-nmehie, ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù-ya.

16. Nwoke ọ bula, mb͕e ure-ya gēsi n'aru-ya pua, ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya nile, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

17. Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

18. Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.

19. Ọzọ, nwayi, mb͕e ọ nwere orùrù, ma orùrù-ya nke di n'anu-aru-ya bu ọbara ubọchi asa ka ọ gānọ n'idi-na-nsọ-ya: onye ọ bula nke nēmetu ya aru gāru kwa árú rue anyasi.

20. Ihe ọ bula nke o nēdinakwasi n'idi-na-nsọ-ya gāru kwa árú: ihe ọ bula kwa nke ọ nānọkwasi gāru árú.

21. Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

22. Onye ọ bula nke nēmetu ihe ọ bula ọ nānọkwasi aru gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

23. Ọ buru kwa na ọ bu n'ihe-ndina ka ọ dikwasi, ma-ọbu n'ihe nke ya onwe-ya nānọkwasi, mb͕e ọ nēmetu ya aru, ọ gāru árú rue anyasi.

24. Ọ buru kwa na ya nwoke edina ma-ọli, idi-na-nsọ-ya adikwasi n'aru nwoke ahu, ọ gāru árú ubọchi asa; ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi gāru kwa árú.

25. Nwayi ọ bula kwa, mbe o nwere orùrù-ọbara nēru ọtutu ubọchi, ma ọ dighi na mb͕e idi-na-nsọ-ya, ma-ọbu mb͕e ọ nwere orùrù gabiga mb͕e idi-na-nsọ-ya; ubọchi nile nke orúrú nke ọrurú-ya ọ gādi ka ubọchi idi-na-nsọ-ya; onye ruru árú ka ọ bu.

26. Ihe-ndina ọ bula nke o nēdinakwasi ubọchi nile nke orùrù-ya gādi ya ka ihe-ndina idi-na-nsọ-ya: ihe ọ bula nke ọ nānọkwasi gāru kwa árú, dika ọrurú idi-na-nsọ-ya.

27. Onye ọ bula nke nēmetu ha aru gāru kwa árú, ọ gāsu kwa uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.

28. Ma ọ buru na emewo ka nwayi ahu di ọcha site n'orùrù-ya, ọ gāgu-kwa-ra onwe-ya ubọchi asa, emesi kwa ọ gādi ọcha.

29. N'ubọchi nke-asatọ ọ gēwere n'onwe-ya nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua, wetara ha onye-nchu-àjà, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

30. Onye-nchu-àjà gēme kwa otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova n'ihi orùrù nke ọrurú-ya.

31. Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha.

32. Nka bu iwu nke onye nwere orùrù, na nke onye ure-ya si n'aru-ya pua, imeru ya nime ya;

33. na nke nwayi nke aru nādighi ya ike n'idi-na-nsọ-ya, na nke onye nwere orùrù, bú orùrù nke nwoke ma-ọbu nke nwayi, na nke nwoke nke ya na nwayi ruru árú nēdina.