isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 6 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n'ihe-ndebe, ma-ọbu n'ihe etiyere n'aka-ya, ma-ọbu n'ihe anapuru madu n'ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya;

3. ma-ọbu mb͕e ọ hutaworo ihe furu efu, o we ghọ aghughọ nime ya, ṅu iyi n'ugha; n'otù nime ihe ndia nile nke madu nēme, nēmehie nime ha:

4. o gēru kwa, mb͕e ọ gēmehie, mb͕e ikpe mara ya, na ọ gēnyeghachi ihe ọ napuru madu n'ike, ma-ọbu ihe ọ nwetara na nmeb͕u, ma-ọbu ihe-ndebe enyere ya idebe, ma-ọbu ihe furu efu nke ọ huta-woro,

5. ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n'ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n'ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya.

6. Ọ gēweta-kwa-ra Jehova àjà-ikpe-ọmuma-ya, bú ebulu zuru okè sitere n'ìgwè ewu na aturu, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, ọ gēwetara onye-nchu-àjà:

7. onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya n'iru Jehova, agāb͕aghara kwa ya ya; bayere ihe ọ bula nime ihe nile nke ọ nēme, nke ikpe mara ya nime ya.

8. Jehova we gwa Moses okwu, si,

9. Nye Eron na umu-ya ndikom iwu, si, Nka bu iwu nke àjà-nsure-ọku: nke ahu bu àjà-nsure ọku bayere orire-ọku n'elu ebe-ichu-àjà ogologo abali nile rue ututu, agēme kwa ka ọku ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya.

10. Onye-nchu-àjà gēyiri kwa uwe-nwuda ákwà ọcha ya, uwe-ukwu ákwà ọcha ya ka o gēyikwasi kwa n'anu-aru-ya; ọ gāchili kwa ntu ahu nke ọku gērechaputa n'àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà, dọba ha na nso ebe-ichu-àjà.

11. O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha.

12. Agēme kwa ka ọku nke di n'elu ebe-ichu-àjà nēre ere n'elu ya, ọ gaghi-anyu anyu; onye-nchu-àjà gēsure nkú ọku n'elu ya kwa-ututu: o gēdo kwa àjà-nsure-ọku n'usoro n'elu ya, sure kwa abuba nke àjà-udo nile ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ya.

13. Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.

14. Nka bu kwa iwu onyinye-inata-iru-ọma: umu-ndikom Eron gēweta ya nso n'iru Jehova, n'iru ebe-ichu-àjà.

15. O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova.

16. Ma ihe fọduru nime ya, Eron na umu-ya ndikom gēri ya: nēkoghi eko ka agēri ya n'ebe di nsọ; n'ogige ulo-ikwū nzute ka ha gēri ya.

17. Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.

18. Nwoke ọ bula n'etiti umu Eron gēri ya, dika ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile, site n'àjà-ọku nke Jehova: onye ọ bula nke nēmetu ha aru gādi nsọ.

19. Jehova we gwa Moses okwu, si,

20. Nka bu onyinye iji biaru nso nke Eron na umu-ya ndikom, nke ha gēwetara Jehova nso n'ubọchi etere ya manu; otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-ọma mb͕e dum, nkera-ya n'ututu, nkera-ya kwa n'anyasi.

21. N'ite isi ihe ka agēwere manu me ya; mb͕e ọ deworo edè i gēwebata ya: iberibe achicha esiri esi nke onyinye-inata-iru-ọma ka i gēweta nso ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova.

22. Onye-nchu-aja etere manu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom gēme ya: ọ bu ukpuru ebighi-ebi Jehova nwere; agēsuresi ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

23. Onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke onye-nchu-àjà ka agēsuresi kwa oku: agaghi-eri ya.

24. Jehova we gwa Moses okwu, si,

25. Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, okwu, si, Nka bu iwu àjà-nmehie: n'ebe anēb͕u ihe àjà-nsure-ọku ka agēb͕u ihe àjà-nmehie n'iru Jehova: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

26. Onye-nchu-àjà nke nāchu ya bayere nmehie gēri ya; n'ebe di nsọ ka agēri ya, n'ogige ulo ikwū nzute.

27. Ihe ọ bula nke nēmetu anu-ya aru gādi nsọ: mb͕e efesara ufọdu nime ọbara-ya n'uwe ọ bula, i gāsu kwa ihe ahu efesara ya n'elu ya n'ebe di nsọ.

28. Ma agētiwa ihe ájá nke esiri ya nime ya: ma ọ buru na n'ihe ọla ka esiri ya, agēchicha ya, ṅacha ya na miri.

29. Nwoke ọ bula n'etiti ndi-nchu-àjà gēri ya: ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.

30. Ọ dighi kwa àjà-nmehie ọ bula agēri, bú nke anēwebata ufọdu nime ọbara-ya n'ulo-ikwū nzute ikpuchi nmehie n'ebe nsọ ahu: agēwere ọku sure ya.