isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 32 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova n'arọ nke-iri nke Zedekaia, bú eze Juda, nke bu arọ nke-iri-na-asatọ nke Nbukadreza.

2. Ma mb͕e ahu usu-ndi-agha eze Babilon nānọchigide Jerusalem n'agha: ma Jeremaia, bú onye-amuma, nọ ka onye eb͕ochibidoworo n'ogige ulo-nche, nke di n'ulo eze Juda.

3. N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;

4. ma Zedekaia, bú eze Juda, agaghi-ewepuga onwe-ya n'aka ndi Kaldea, kama aghaghi inye ya n'aka eze Babilon, ha gēkwurita kwa ọnu na ọnu, anya-ya gāhu kwa anya-ya:

5. ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?

6. Jeremaia we si, Okwu Jehova rurum nti, si,

7. Le, Hanamel nwa Shalum, bú nwa-nne nna-gi, gābiakute gi, si, Zutara onwe-gi ubim nke di n'Anatot: n'ihi na gi ka nb͕aputa ruru izuru ya.

8. Hanamel nwa nwa-nne nnam we biakutem, dika okwu Jehova si di, rue ogige ulo-nche, sim, Biko, zuru ubim nke di n'Anatot, nke di n'ala Benjamin: n'ihi na gi ka nnweta-ya ruru, ọ bu kwa gi nwe nb͕aputa-ya; zutara onwe-gi. M'we mara na okwu Jehova ka nka bu.

9. M'we zuru ubi ahu n'aka Hanamel nwa nwa-nne nnam, bú nke di n'Anatot, m'we tùara ya ego-ya, bú shekel iri na asa nke ọla-ọcha.

10. M'we de aham n'akwukwọ ala ahu, ka ya akàrà, kpọ ndi-àmà, tùara ya ego ahu n'ihe-ọtùtù.

11. M'we were akwukwọ nzuta-ala ahu, ma nke akara akàrà, nke ihe-ya enyere n'iwu na ukpuru-ya nile di nime ya, ma nke ghere oghe:

12. m'we were akwukwọ nzuta-ala ahu nye Beruk nwa Neraia, nwa Mahseia, n'anya Hanamel nwa nwa-nne nnam, na n'anya ndi-àmà ndi deworo aha-ha n'akwukwọ nzuta-ala ahu, n'anya ndi-Ju nile ndi nānọdu ala n'ogige ulo-nche ahu.

13. M'we nye Beruk iwu n'anya ha, si,

14. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Chiri akwukwọ ndia, bú akwukwọ nzuta-ala nka, ma nke akara akàrà, ma akwukwọ a nke ghere oghe, tiye ha n'ite urọ; ka ha we digide ọtutu ubọchi.

15. N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Agāzu kwa ulo na ubi na ubi-vine ọzọ n'ala nka.

16. M'we kpere Jehova ekpere, mb͕e m'nyesiri Beruk nwa Neraia akwukwọ nzuta-ala, ahu, si,

17. Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:

18. Gi onye nēmere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nākwughachi ajọ omume nke ndi bu nna n'obi umu-ha gēsota ha n'azu: Chineke uku, nke bu dike, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:

19. I di uku na ndum-ọdu, di kwa ike n'omume: Onye anya-Gi ghere oghe ilekwasi uzọ nile nke umu madu; inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, na dika nkpuru omume-ya nile si di:

20. Onye doro ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'ala Ijipt, rue ta, ma n'etiti Israel ma n'etiti madu ọzọ; I we mere Onwe-gi aha, dika ta;

21. I we ji ihe-iriba-ama di iche iche, ji kwa ihe-ebude di iche iche, ji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka setiri eseti, ji kwa egwu di uku, me ka ndi-Gi, bú Israel, si n'ala Ijipt puta;

22. I we nye ha ala nka, nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya;

23. ha we bata, nweta ya; ma ha egeghi nti olu-Gi, ọ bu kwa n'iwu-Gi ka ha nējegharighi; n'ihe nile nke I nyere ha n'iwu ime ọ dighi nke ha meworo: I we me ka ihe ọjọ a nile dakwasi ha:

24. Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.

25. Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi Jehova, asiwom, Were ego zutara onwe-gi ubi ahu, kpọ kwa ndi-àmà; ma enyewo obodo a n'aka ndi Kaldea.

26. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si,

27. Le, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke anu-aru nile, bú madu: ọ̀ di ihe ọ bula karirim ime?

28. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye obodo a n'aka ndi Kaldea, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, ọ gēwere kwa ya:

29. ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n'elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.

30. N'ihi na umu Israel na umu Juda aghọwo nání ndi nēme ihe jọrọ njọ n'anyam abua site na mb͕e ha di na nwata: n'ihi na umu Israel bu nání ndi ji ọlu aka-ha akpasum iwe; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

31. N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya:

32. n'ihi ihe ọjọ ahu nile nke umu Israel na nke umu Juda, nke ha meworo ikpasum iwe, ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-àjà-ha, na ndi-amuma-ha, na ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem.

33. Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.

34. Ha we do ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.

35. Ha we wue ebe nile di elu nke Beal, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, ime ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom si n'ọku gabigarue Molek; bú ihe nke M'nēnyeghi ha n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim, ka ha we me ihe-árú a; ime ka Juda mehie.

36. Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe:

37. si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:

38. ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke:

39. M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma:

40. Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha.

41. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.

42. N'ihi na otú a ka Jehova siri: Dika M'meworo ka ihe ọjọ uku a nile biakute ndi nka, otú a ka Mu onwem nēme ka ezi ihe ahu nile biakwasi ha, bú nke Mu onwem nēkwu bayere ha.

43. Agāzú kwa ọhia n'ala nka, nke unu onwe-unu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu bi nime ya; enyewo ya n'aka ndi Kaldea.

44. Ubi ka agāzú nēgo, de kwa aha n'akwukwọ-ha, ka kwa ha akàrà, kpọ kwa ndi-àmà, n'ala Benjamin, na n'ebe nile di Jerusalem buruburu, na n'obodo nile nke Juda, na n'obodo nile nke ugwu, na n'obodo nile nke ebe di ala ala, na n'obodo nile nke Negeb: n'ihi na M'gēme ka ndi-ha adọtara n'agha lata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.