isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 26 Bible Nso (IGBOB)

1. Na nmalite nke ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a sitere na Jehova, si,

2. Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.

3. Eleghi anya ha gānu, we lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke Mu onwem nēchè ime ha n'ihi ihe ọjọ nke omume nile ha.

4. I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ọ buru na unu egeghm nti, ijehari n'iwum nke M'tiyeworo n'iru unu,

5. ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;

6. M'gēme kwa ka ulo a di ka Shailo, ọ bu kwa obodo a ka M'gēme ka ọ ghọrọ mba nile nke uwa ihe-nkọcha.

7. Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile we nu ka Jeremaia nēkwu okwu ndia n'ulo Jehova.

8. O rue, mb͕e Jeremaia kwubìri okwu nile nke Jehova nyere ya n'iwu igwa ndi Israel nile, na ndi-nchu-àjà na ndi-amuma na ndi Israel nile jidere ya, si, I ghaghi inwu anwu.

9. Gini mere i buworo amuma n'aha Jehova, si, Ulo a gādi ka Shailo, obodo a gābu kwa nkpọnkpọ ebe, ghara inwe onye-obibi? Ewe kpọkọta ndi Israel nile n'ebe Jeremaia nọ n'ulo Jehova.

10. Ndi-isi Juda we nu ihe ndia, ha we si n'ulo eze rigota n'ulo Jehova; ha we nọdu ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova.

11. Ndi-nchu-àjà na ndi-amuma we gwa ndi-isi na ndi Israel nile okwu, si, Ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na o buwo amuma megide obodo a, dika unu jiworo nti-unu nu.

12. Jeremaia we gwa ndi-isi nile, gwa ndi Israel nile, okwu, si, Jehova ziterem ibu amuma okwu nile nke unu nuworo megide ulo a na imegide obodo a.

13. Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.

14. Ma mu onwem, le, adim n'aka-unu: menum ka o si di nma na ka o si zie ezie n'anya-unu.

15. Nání, maranu nke-ọma na, ọ buru na unu eme ka m'nwua, ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ ka unu onwe-unu nātukwasi n'aru unu, na n'aru obodo a, na n'aru ndi bi ya: n'ihi na n'ezi-okwu Jehova ezitewom ibiakute unu ikwu okwu ndia nile na nti-unu.

16. Ndi-isi na ndi Israel nile we si ndi-nchu-àjà, si kwa ndi-amuma, Ọ dighi ikpé ọnwu kwesiri nwoke a; n'ihi na ọ bu n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, ka gwaworo ayi okwu.

17. Ufọdu nime ndi-okenye ala we bilie, gwa nkpọkọta ahu nile nke ndi Israel okwu, si,

18. Maika onye Moreshet nēburi amuma n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda; o we gwa ndi Juda nile okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agēji ploughi gwu Zaion dika ubi, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.

19. Hezekaia, bú eze Juda, na Juda nile, hà mere ya ka ọ nwua ma-ọli? ọ̀ tughi egwu Jehova, we chọ ka iru Jehova dajua, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu nke O kwururi megide ha? Ma ayi onwe-ayi nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi-ayi.

20. Ọzọ kwa, otù nwoke di nke nēbu amuma n'aha Jehova, bú Uraia nwa Shemaia nke sitere na Kiriat-jearim; o we bue amuma megide obodo a, megide kwa ala nka, dika okwu nile nke Jeremaia si di:

21. Jehoiakim, bú eze, na ndi-dikei ya nile, na ndi-isi nile, we nu okwu-ya nile, eze we chọ ime ka ọ nwua; Uraia we nu ya, tua egwu, b͕alaga, we ba n'Ijipt:

22. Jehoiakim, bú eze, we ziga ndikom n'Ijipt, bú Elnetan nwa Akboa, na ndikom ufọdu so ya, ijeru Ijipt:

23. ha we me ka Uraia si n'Ijipt puta, ha we me ka ọ biakute eze, bú Jehoiakim; o we were mma-agha tibue ya, tubà ozu-ya n'ílì umu ndi Israel.