isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 34 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Nebukadneza, bú eze Babilon, na usu-ndi-agha-ya nile, na ala-eze nile nke uwa nke aka-ya nāchi, na ndi nile di iche iche, nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo-ya nile, agha, si:

2. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Je, gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēsure kwa ya n'ọku:

3. ma gi onwe-gi aghaghi-iwepuga onwe-gi n'aka-ya, kama aghaghi iwere gi, ọ bu kwa n'aka-ya ka agēnye gi; anya-gi abua gāhu kwa anya abua nke eze Babilon, unu gēkwurita kwa ọnu na ọnu, ọ bu kwa Babilon ka i gābà.

4. Ma otú ọ di, nuru okwu Jehova, gi Zedekaia, bú eze Juda: okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere gi, si, I gaghi-anwu site na mma-agha:

5. n'udo ka i gānwu; ọzọ, nsure nile nke nna-gi-hà, bú ndi-eze mbu, ndi buru gi uzọ, otú a ka ha gēsurere gi ihe; ọzọ, Éwù, onye-nwe-ayi! ka ha gāsi n'itiri gi aka n'obi; n'ihi na okwu ka Mu onwem kwuworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

6. Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem,

7. mb͕e usu-ndi-agha nke eze Babilon nēbuso Jerusalem, nēbuso kwa obodo Juda nile fọduru, agha, bú Lekish na Azeka; n'ihi na nání ndia fọduru nime obodo nile nke Juda, bú obodo ewusiri ike.

8. Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;

9. na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:

10. ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:

11. ma emesia ha chighariri, me ka ndi-orù-ha ndikom na ndinyom ndi nējere ha ozi, bú ndi ha zilagarari inwere onwe-ha, lata, ha we buda ha ka ha buru orù-ndikom na ndinyom nējere ha ozi:

12. okwu Jehova we rue Jeremaia nti site na Jehova, si,

13. Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Mu onwem na nna-unu-ha b͕ara ndu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta, si,

14. N'ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n'aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala.

15. Unu onwe-unu we chigharia ta, we me ihe ziri ezi n'anyam abua, n'ikpọsa, onye ọ bula ọ gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya pua n'aka-gi; unu we b͕a ndu n'irum n'ulo nke akpọkwasiri aham:

16. unu we chigharia me ka aham ghara idi nsọ, me, onye ọ bula o me orù-ya nwoke, onye ọ bula o me nwanyi nke nējere ya ozi, ka ha lata, bú ndi unu zilagarari inwere onwe-ha n'ọchichọ nkpuru-obi-ha; unu we buda ha iburu unu orù-ndikom na ndinyom nējere unu ozi.

17. N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.

18. M'gēwere kwa ndikom ndi nējehie n'ọb͕ub͕a-ndum nye, bú ndi nēmeghi ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke ha b͕ara n'irum guzosie ike, bú nwa-ehi nke ha kpọwara abua, we gabiga n'etiti nkpọwa-ya abua;

19. bú ndi-isi Juda, na ndi-isi Jerusalem, na ndi-onozi, na ndi-nchu-àjà, na ndi nile nke ala nka, ndi gabigaworo n'etiti nkpọwa abua nke nwa-ehi ahu;

20. M'gēwere ha nye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ozu-ha ewe ghọrọ anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anu-ọhia nke uwa, ihe-oriri.

21. Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n'ebe unu nọ rigo la.