isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 36 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, na okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2. Were n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M'gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n'ubọchi M'gwara gi okwu, site n'ubọchi Josaia, we rue ta.

3. Eleghi anya ulo Juda gānu ihe ọjọ ahu nile nke Mu onwem nēchè ime ha; ka ha we lata, onye o bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we b͕aghara ajọ omume-ha na nmehie-ha.

4. Jeremaia we kpọ Beruk nwa Neraia; Beruk we dere n'ọnu Jeremaia okwu nile nke Jehova, nke Ọ gwara ya-ri, n'akwukwọ-npiakọta.

5. Jeremaia we nye Beruk iwu, si, Mu onwem bu onye eb͕ochibidoworo; apughm ibà n'ulo Jehova:

6. ma gi onwe-gi je, gua n'akwukwọ-npiakọta ahu, nke i deworo site n'ọnum, okwu nile nke Jehova na nti ndi Israel, n'ulo Jehova n'ubọchi obubu-ọnu: ọ bu kwa na nti Juda nile ndi si n'obodo nile ha abia ka i gāgu ha.

7. Eleghi anya aririọ-amara-ha gāda n'iru Jehova, ha ewe lata, onye ọ bula o si n'uzọ ọjọ ya lata: n'ihi na ọ di uku, bú iwe ahu na ọnuma ahu nke Jehova kwuworo megide ndi nka.

8. Beruk nwa Neraia we me dika ihe nile si di nke Jeremaia, bú onye-amuma, nyere ya n'iwu, o we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jehova n'ulo Jehova.

9. O rue, n'arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n'obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n'iru Jehova.

10. Beruk we gua n'akwukwọ ahu okwu nile nke Jeremaia n'ulo Jehova, n'ime-ulo Gemaraia nwa Shefan, bú ode-akwukwọ, n'ogige nke di n'elu, n'oghere ọnu-uzọ-ama ọhu nke ulo Jehova, na nti ndi Israel nile.

11. Maikaia nwa Gemaraia, nwa Shefan, we nuru okwu nile nke Jehova nke sitere n'akwukwọ ahu,

12. o we rida n'ulo eze, rue ime-ulo nke ode-akwukwọ: ma, le, n'ebe ahu ka ndi-isi nile nānọdu, bú Elishama ode-akwukwọ, na Delaia nwa Shemaia, na Elnetan nwa Akboa, na Gemaraia nwa Shefan, na Zedekaia nwa Hananaia, na ndi-isi nile.

13. Maikaia we gosi ha okwu nile ọ nuru, mb͕e Beruk nāgu akwukwọ ahu na nti ndi Israel nile.

14. Ndi-isi nile we zìe Jehudi nwa Netanaia, nwa Shelemaia, nwa Kushi, jekuru Beruk, si, Akwukwọ-npiakọta ahu nke iguworo ihe nime ya na nti ndi Israel, were n'aka-gi bia. Beruk nwa Neraia we were akwukwọ-npiakọta ahu n'aka-ya, biakute ha.

15. Ha we si ya, Biko, nọdu ala, gua ya na nti-ayi. Beruk we gua ya na nti-ha.

16. O rue, mb͕e ha nusiri okwu ndia nile, na ha turu oké egwu, onye na ibe-ya, ha we si Beruk, Ayi aghaghi igosi eze okwu ndia nile.

17. Ha we jua Beruk, si, Biko, gosi ayi, Ì siri aṅa deputa okwu ndia nile n'ọnu-ya?

18. Beruk we si ha, N'ọnu-ya ka ọ nākpọrọm okwu ndia nile, ma mu onwem were ink ede ha n'akwukwọ a.

19. Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ.

20. Ha we bakuru eze n'ogige; ma ha debereri akwukwọ-npiakọta ahu n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ; ha we gosi okwu nile na nti abua nke eze.

21. Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n'akuku eze.

22. Ma eze nānọdu n'ulo mb͕e oyi n'ọnwa nke-iteghete: ọku nēnwu kwa n'ite-ọku nke di n'iru ya.

23. O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku.

24. Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.

25. Ọzọ kwa, Elnetan na Delaia na Gemaraia riọrọri eze arìriọ ka ọ ghara isure akwukwọ-npiakọta ahu: ma o geghi ha nti.

26. Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.

27. Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, mb͕e eze suresiri akwukwọ-npiakọta ahu, na okwu nile nke Beruk deputara n'ọnu Jeremaia, si,

28. Were kwa n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta ọzọ, dekwasi na ya okwu mbu nile nke di n'elu akwukwọ-npiakọta mbu, nke Jehoiakim, bú eze Juda, sureworo ọku.

29. Ma i gēkwu okwu bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si, Otú a ka Jehova siri: Gi onwe-gi esurewo akwukwọ-npiakọta nka ọku, si, Gini mere i ji dekwasi n'akwukwọ a, si, Eze Babilon aghaghi ibia bibie ala nka, me ka madu na anumanu kwusi nime ya?

30. N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n'oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n'ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n'abali.

31. M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.