isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jeremaia 50 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Babilon, bayere ala ndi Kaldea, site n'aka Jeremaia, bú onye-amuma.

2. Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.

3. N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.

4. N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), umu Israel gābia, ha onwe-ha na umu Juda n'otù; ha ganēje ije nākwa ákwá, ọ bu kwa Jehova, bú Chineke-ha, ka ha gāchọ.

5. Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n'ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n'aru Jehova n'ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.

6. Ìgwè ewu na aturu nāla n'iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n'ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n'ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.

7. Ndi nile ndi nāchọputa ha eripiawo ha: ndi nākpab͕u ha siri, Ikpe amaghi ayi, n'ihi na ha emehiewo megide Jehova, bú ebe-obibi nke ezi omume, na olile-anya nke ndi bu nna-ha, bú Jehova.

8. Sinu n'etiti Babilon wagharia, si-kwa-nu n'ala ndi Kaldea pua, di-kwa-nu ka nkpi n'iru ìgwè ewu na aturu.

9. N'ihi na, le, Mu onwem gaje ikpọte me ka nkpọkọta mba uku di iche iche si n'ala Ugwu rigoputa imegide Babilon: ha gēdo kwa onwe-ha n'usoro megide ya; agēsi n'ebe ahu were ya: àkú nke usu ahu gādi ka nke dike nke bu ọ̀kà-uta; ọ gaghi-alaghachi azu n'efu.

10. Kaldea gāghọ kwa ihe-nkwata: afọ gēju ndi nile ndi nākwata ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

11. N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;

12. ihere gēme nne-unu nke-uku; nwanyi nke muru unu gēnwe iru-ihere: le, ọ gābu ọdudù mba nile, na ọzara, na ala kpọrọ nku, na ala ihe nādighi.

13. Site n'iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n'efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.

14. Donu onwe-unu n'usoro imegide Babilon buruburu, unu ndi nile ndi nāzọ uta ukwu ikwe ya; b͕anu ya, unu asọlara àkú anya: n'ihi na Jehova ka o mehieworo megide.

15. Kpọnu nkpu-agha megide ya buruburu; o kweyewo ekweye; ihe-nkwagide-ya nile adawo, etikpọwo kwa mb͕idi-ya nile: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu: bọ̀nu ya ọ́bọ̀; dika ọ meworo, menu ya otú a.

16. Bipunu ọgha-nkpuru nime Babilon, ya na onye nēji mma-iwe-ihe-ubi na mb͕e owuwe-ihe-ubi: n'iru mma-agha nēme ihe-ike ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula n'ala-ya.

17. Aturu nke emeworo ka ọ wagharia ka Israel bu; ọdum di iche iche achupuwo ya: ọdum nke-mbu, bú eze Asiria, ripiara ya; ma ọdum ikpe-azu a, bú Nebukadreza eze Babilon, ab͕ajiwo ọkpukpu-ya nile.

18. N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje iji nmehie-ya leta eze Babilon, leta kwa ala-ya, dika M'jiworo nmehie eze Asiria leta ya.

19. M'gēme kwa ka Israel lata n'ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n'ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya.

20. N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.

21. Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu.

22. Olu agha di n'ala nka, na olu ntipia uku.

23. Le ka esiworo bipu otùtù nke uwa nile, b͕aji kwa ya nke-uku! le ka Babilon siworo ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku n'etiti mba nile!

24. Esiworom i ọnyà, ọzọ kwa, amawo gi n'ọnyà ahu, gi Babilon, ma gi onwe-gi amagh: achọtawo gi, ọzọ kwa, ejidewo gi, n'ihi na Jehova ka i lusoworo ọ̀gù.

25. Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n'ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n'ala ndi Kaldea.

26. Sinu na nsọtu-ya biarue ya, meghenu ọba-ya nile: tulienu ya dika obo-ihe, wezuga-kwa-nu ya ka ebibie ya: ekwela ka ihe fọduru ya.

27. Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.

28. Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.

29. Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.

30. N'ihi nka ka umu-okorọbia-ya gāda n'amá-ya nile, agēme kwa ka ndi-agha-ya nile dere du n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

31. Le, Mu nēmegide gi, gi onye-nganga, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta): n'ihi na ubọchi-gi abiawo, bú mb͕e M'gēleta gi.

32. Onye-nganga gāsu kwa ngọngọ, da, ma ọ dighi onye ganēme ka o bilie: M'gēsuye kwa ọku n'obodo ya nile, o gēripia kwa ebe nile di ya buruburu.

33. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n'otù: ndi nile dọtaworo ha n'agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha.

34. Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.

35. Mma-agha di n'aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na n'ebe ndi bi na Babilon nọ, na n'ebe ndi-isi-ya nọ, na n'ebe ndi-ya mara ihe nọ.

36. Mma-agha di n'ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha: mma-agha di n'ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.

37. Mma-agha di n'ebe inyinya-ya nile di, na n'ebe ub͕ọ-ala-ya di, na n'ebe ndi nile gwara ọgwa nọ, bú ndi nọ n'etiti ya, ha gāghọ kwa ndinyom: mma-agha di n'ebe àkù-ya nile di, agāluta kwa ha n'agha.

38. Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.

39. N'ihi nka ka anu-ọhia di iche iche nke bi n'ala kpọrọ nku gēbi n'ebe ahu, ha na anu-ọhia nke nēbe ebe, enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu: madu agaghi-ebi kwa nime ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ gaghi-abu kwa ebe-obibi rue ọb͕ọ nile.

40. Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.

41. Le, otù ndi nēsi n'Ugwu bia; ọzọ, mba uku na ọtutu ndi-eze ka agākpọte site na nsọtu nile nke uwa.

42. Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ha bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕ọ dika oké osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Babilon.

43. Eze Babilon anuwo ùdé-ha, aka-ya abua we kuda: ihe-nb͕u ejidewo ya, ihe-nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme.

44. Le, dika ọdum ka ọ nārigo, bú nke si na nbili-elu nke Jọdan arigo, rue ebe-ita-nri nādigide mb͕e nile: ma n'otù ntabi-anya ka M'gēme ka ha si n'aru ya b͕a ọsọ; ma ònye bu onye arọputara? onye-nlekọta-ya ka M'gēme ya: n'ihi na ònye di kam? ọ̀ bu kwa onye gākaram mb͕e? ma-ọbu ònye bu kwa onye-ọzùzù-aturu a nke gēguzo n'irum?

45. N'ihi nka nurunu ndum-ọdu Jehova, nke Ọ duworo megide Babilon; na èchìchè-Ya nile nke O chèworo megide ala ndi Kaldea, si: N'ezie ha gādọkpupu ha, bú ndi ntà nke ìgwè ewu na aturu: n'ezie ọ gēju ebe-ita-nri-ha anya bayere ha.