isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 26 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si,

2. Nwa nke madu, n'ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n'ebe m'nọ: m'gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe:

3. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.

4. Ha gēbibi kwa mb͕idi nile nke Taia, kwatue ulo-elu-ya nile: M'gākọchapu kwa ájá-ya n'aru ya, me ya ka ọ ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya.

5. Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n'etiti oké osimiri; n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha.

6. Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n'ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

7. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.

8. Umu-gi ndinyom ndi nọ n'ọhia ka ọ gēji mma-agha b͕u: ọ gēwu kwa ulo-agha megide gi, wukọta obo-ihe imegide gi, welie ọta uku imegide gi.

9. Ọzọ, ihe-ya eji akwatu mb͕idi ka ọ gādọba imegide mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo-elu-gi nile ka o gēji mma-agha-ya kwada.

10. Site n'ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n'olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n'obodo nke ab͕awara ab͕awa.

11. O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n'ala.

12. Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.

13. M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.

14. M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n'olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n'etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu?

16. Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.

17. Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n'iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n'oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n'oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha!

18. Ub͕u a ka agwe-etiti gāma jijiji n'ubọchi ọdida-gi; e, ibobo gānwu agwe-etiti nile nke di n'oké osimiri n'aru n'ọpupu-gi.

19. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M'gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi;

20. M'gēme kwa ka i rida, gi na ndi nārida n'olùlù, ijekuru ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, M'gēme kwa ka i bi n'ala di n'okpuru uwa, n'ebe di nkpọnkpọ site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, gi na ndi nārida n'olùlù, ka madu we ghara ibi nime gi; M'gētiye kwa ima-nma n'ala ndi di ndu:

21. ihe-ima-jijiji ka m'gēme gi ka i buru, i gaghi-adi kwa ọzọ: agāchọ kwa gi, ma agaghi-achọta kwa gi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.