isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 15 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, gini ka osisi vine bu kari osisi ọ bula, bú alaka vine nke diworo n'etiti osisi nile nke oké ọhia?

3. Àgēsi nime ya were osisi ime ihe ije ozi? ma-ọbu àgēsi nime ya were nkpukpọ ikokwasi ihe ọ bula n'elu ya?

4. Le, n'ọku ka atubàworo ya ibu nri-ya: isi-ya abua ka ọku ripiaworo, etiti-ya anujiwo kwa; ọ̀ gābà n'ije-ozi ọ bula?

5. Le, mb͕e o zuru okè, adighi-ewere ya me ihe ije ozi: àgēsi kwa aṅa were ya me ihe ije ozi ọzọ, mb͕e ọku ripiaworo ya, o we nujie?

6. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n'etiti osisi oké ọhia, nke M'nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M'nyeworo ndi bi na Jerusalem.

7. M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.

8. M'gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.