isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ì gēkpe ikpe, ì gēkpe obodo ọbara nka ikpe? i gēme kwa ka ọ mara ihe-árú nile ya.

3. I gāsi kwa, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le obodo nke nāwusi ọbara n'etiti ya, ka mb͕e-ya we bia, nke nēme kwa arusi di iche iche megide onwe-ya imeru onwe-ya!

4. N'ọbara-gi, bú nke i wusiworo, ka ikpe maworo gi, ọ bu kwa n'arusi-gi nile, bú nke i meworo, ka i ruru árú; i we me ubọchi-gi ka ha biarue nso, i we biarue ọgwugwu arọ-gi nile: n'ihi nka ka M'meworo gi ka i ghọrọ mba nile ihe-ita-uta, ka i ghọ-kwa-ra ala nile ihe-ọchì.

5. Ndi di nso na ndi di anya n'ebe i nọ gāchì gi ọchì, gi obodo nke aha-gi ruru árú, nke juputara n'ọb͕ub͕a-aghara.

6. Le, ndi-isi Israel, onye ọ bula ka ogwe-aka-ya ra, anọwo nime gi iwusi ọbara.

7. Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.

8. Ihe nsọm nile ka i ledaworo anya, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka i meworo ka ha ghara idi nsọ.

9. Ndi nāb͕a àmà ọjọ anọwo nime gi iwusi ọbara: ọ bu kwa n'ugwu nile ka ha riworo ihe nime gi: ajọ ihe-nzube ka ha meworo n'etiti gi.

10. Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n'idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n'ala nime gi.

11. Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.

12. Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

13. Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.

14. Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.

15. M'gāchusa kwa gi n'etiti mba nile, fesa kwa gi n'ala nile; M'gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia.

16. Agēme kwa ka i ghara idi nsọ n'onwe-gi, n'anya mba nile; i we mara na Mu onwem bu Jehova.

17. Okwu Jehova we ruem nti, si,

18. Nwa nke madu, ulo Israel aghọworom afuru-uzu: ha nile bu ọla na b͕amb͕am na ígwè na opù, n'etiti oké ọku; afuru-uzu nke ọla-ọcha ka ha ghọworo.

19. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu nile aghọwo afuru-uzu, n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta unu n'etiti Jerusalem.

20. Dika esi achikọta ọla-ọcha na ọla na ígwè na opù na b͕amb͕am n'etiti oké ọku, ifunwu ya ọku, ib͕aze ya; otú a ka M'gāchikọta unu n'iwem na n'ọnumam, tọb͕ọ unu n'ebe ahu, b͕aze unu.

21. E, M'gākpọkọta unu, were ọku nke nrubiga-ókè nke iwem fukwasi unu, unu ewe b͕aze n'etiti ya.

22. Dika esi ab͕aze ọla-ọcha n'etiti oké ọku, otú a ka agāb͕aze unu n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, awukwasiwo unu ọnumam.

23. Okwu Jehova we ruem nti, si,

24. Nwa nke madu, si ya, Gi onwe-gi bu ala nke anēmeghi ka ọ di ọcha, miri ezokwasighi ya n'ubọchi ajọ iwe.

25. Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n'etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n'etiti ya.

26. Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha.

27. Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.

28. Ọzọ, ndi-amuma-ya eteworo ha nzu, nāhu ọhù efu, nāju-kwa-ra ha ase okwu-ugha, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, ma Jehova ekwughi okwu.

29. Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.

30. M'we chọ otù onye n'etiti ha, onye gaje ib͕a ogige, guzo kwa na ntipú n'irum n'ihi ala-ya, ka M'we ghara ibibi ya: ma achọtaghm.

31. M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.