isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 27 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;

3. si Taia, Gi onye bi na ab͕ata oké osimiri, onye bu onye-ahia nke ndi nile di iche iche rue ọtutu agwe-etiti, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Taia, gi onwe-gi asiwo, Mu onwem bu ebe mazuru nma.

4. N'etiti oké osimiri ka ókè-ala-gi nile di, ndi wuworo gi emewo ka ima-nma-gi zue okè.

5. Osisi fir nke si na Senia aputa ka ha jiworo mere gi ibo-ub͕ọ nile: osisi cedar nke si na Lebanon aputa ka ha wereworo imere gi akpu-ub͕o.

6. Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.

7. Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n'Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n'agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo.

8. Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi.

9. Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi.

10. Peasia na Lud na Put anọwo n'usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi.

11. Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n'elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n'ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké.

12. Tashish bu onye-ahia-gi site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; ọla-ọcha na ígwè na b͕amb͕am na opù ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi nile.

13. Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi.

14. Ndi ulo Togama chiri inyinya na ndi-inyinya na inyinya mule zua ihe-ahia-gi nile.

15. Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi.

16. Siria bu Onye-ahia-gi site n'iba-uba nke ihe di iche iche i mere ire ere: emerald, na ákwà ododo, na ákwà akpara nke-ọma, na ezi ákwà ọcha, na coral, na ruby, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi nile.

17. Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.

18. Damaskọs bu onye-ahia-gi n'ihi iba-uba nke i mere ire ere, site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; o jiri manya-vine Helbon na aji-anu di ọcha zu.

19. Vedan na Jevan nēwere ogho aturu atu zua ihe-ahia-gi nile: ígwè nwupuru enwupu, na cassia, na calamus, adiwo n'etiti ihe-izu-ahia-gi.

20. Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.

21. Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.

22. Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.

23. Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.

24. Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n'ihe di iche iche mazuru nma, n'ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n'ib͕e juputara n'uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n'etiti ihe-ahia-gi.

25. Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n'etiti oké osimiri nile.

26. Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile.

27. Àkù-gi, na ihe-ahia-gi nile, na ihe-izu-ahia-gi, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi, na ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi, na ndi nāzu ahia-gi, na ndi-agha-gi nile, ndi nọ nime gi, na nime nkpọkọta-madu nile nke gi nke di n'etiti gi, gādabà n'etiti oké osimiri nile n'ubọchi ọdida-gi.

28. N'olu iti-nkpu nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi azu-obodo-gi nile gēme nkpatu.

29. Ndi nile ndi nānya umara, na ndi-ub͕ọ, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ nile nke oké osimiri, gēsi kwa n'ub͕ọ-ha ridata, n'elu ala ka ha gēguzo,

30. me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:

31. ha gēme-kwa-ra onwe-ha isi-nkwọcha n'ihi gi, ke ákwà-nkpe n'úkwù, kwara gi ákwá n'idi-ilu nke nkpuru-obi n'iti-aka-n'obi di ilu.

32. Ha gēbuliri gi abù-ákwá n'igo-ákwá-ha, bùara gi abù-ákwá, si, Ònye di ka Taia, ònye di ka obodo ahu nke emere ka o dere du n'etiti oké osimiri?

33. Mb͕e ihe-ahia-gi nile siri n'oké osimiri nile puta, i mere ka afọ ju ọtutu ndi di iche iche; i jiri iba-uba nke àkù-gi na nke ihe-izu-ahia-gi nile me ndi-eze nke uwa ka ha buru ọgaranya.

34. Na mb͕e etiwara gi site n'oké osimiri nile n'ebe miri emi nke miri, ihe-izu-ahia-gi na nkpọkọta-madu nile nke gi dara ada n'etiti gi.

35. I juwo ndi nile bi n'agwe-etiti nile anya, ndi-eze-ha atuwo ujọ nke-uku, iru-ha ab͕arusiwo.

36. Ndi-ahia n'etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.