isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 28 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:

3. le, onye nke mara ihe ka i bu karia Daniel; ọ dighi ihe-nzuzo ha zonariworo gi:

4. i jiwo amam-ihe-gi, ji kwa nghọta-gi, lutara onwe-gi àkù, i we luta ọla-edo na ọla-ọcha n'àkù-gi nile:

5. i jiwo iba-uba nke amam-ihe-gi, ji kwa ọzuzu-ahia-gi, me ka àkù-gi ba uba, obi-gi we di elu n'ihi àkù-gi:

6. n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i doworo obi-gi ka obi Chineke,

7. n'ihi nka, le, M'gēme ka ndi ala ọzọ biakwasi gi, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji: ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide ima-nma nke amam-ihe-gi, me ka onwunwu-ìhè-gi ghara idi nsọ.

8. Rue olùlù ka ha gēme ka i rida; i gānwu kwa ọnwu nke ndi eb͕uru eb͕u, n'etiti oké osimiri nile.

9. Ì gāsi n'ezie, Chineke ka m'bu, n'iru onye nēb͕u gi? ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, n'aka onye nēme gi ka i ghara idi nsọ.

10. Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

11. Okwu Jehova we ruem nti, si,

12. Nwa nke madu, buliere eze Taia abù-ákwá, si ya, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Gi onwe-gi bu onye nākachi ọtùtù-ihe akàrà, nke juputara n'amam-ihe, mazu kwa nma.

13. N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.

14. Gi onwe-gi bu cherub ahu etere manu nke nēkpuchi ekpuchi: M'we do gi, n'ugwu nsọ nke Chineke ka i nọrọ; n'etiti nkume ọku ka i jeghariworo.

15. Onye zuru okè ka i bu n'uzọ-gi nile n'ubọchi ekère gi, rue mb͕e ahuru ajọ omume nime gi.

16. Ha ejiwo iba-uba nke ọzuzu-ahia-gi mejue etiti-gi n'ihe-ike, i we mehie: M'we me ka i si n'ugwu Chineke pua dika ihe nādighi nsọ; M'we me ka i la n'iyì, gi cherub nke nēkpuchi ekpuchi, pua n'etiti nkume ọku.

17. Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi.

18. Site n'iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ajọ omume nke ọzuzu-ahia-gi, ka i meworo ebe nsọ gi ka ha ghara idi nsọ: M'we me ka ọku si n'etiti gi puta, nke ahu eripiawo gi, M'we me ka i ghọ ntu n'elu ala n'anya ndi nile nāhu gi.

19. I juwo ndi nile mara gi n'etiti ndi nile di iche iche anya: oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.

20. Okwu Jehova we ruem nti, si,

21. Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe Zaidon di, bue amuma megide ya,

22. si, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Zaidon; ewe sọpurum n'etiti gi: ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri nime ya ihe nile ekpere n'ikpe, ewe dom nsọ nime ya.

23. N'ihi na Mu onwem gēzite ajọ ọria nēfe efe na ọbara nime ya n'èzí-ya nile; ndi eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya mb͕e mma-agha di n'aru ya buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

24. Uke nke nādu adu agaghi-adi-kwa-ra ulo Israel ọzọ, ogwu nke nēb͕u nb͕u agaghi-adi kwa sitere na ndi nile nọ ha buruburu, ndi nēlelì ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

25. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gāchikọputawori ulo Israel n'etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n'etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n'anya mba nile, ha gēbi kwa n'elu ala-ha, nke M'nyere orùm, bú Jekob.

26. Ha gēbi n'elu ya na ntukwasi-obi; ha gēwu kwa ulo, kua ubi-vine, biri na ntukwasi-obi; mb͕e M'mesiri ihe nile ekpere n'ikpe n'aru ndi nile nēlelì ha n'ebe nile di ha buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.