isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 19 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma gi onwe-gi, buliere ndi-isi Israel abù-ákwá,

2. si, Gini ka nne-gi bu? Ọ bu nne-ọdum: n'etiti ọdum ka ọ makpuru, n'etiti umu-ọdum ka o mere ka umu-ya ba uba.

3. O we zùputa otù n'umu-ya; nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

4. Mba di iche iche we nu ihe bayere ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya: ha ji nb͕a-aka-imi me ka ọ biarue ala Ijipt.

5. Nne-ọdum ahu we hu na o chereri, ma na olile-anya-ya alawo n'iyì, o we were otù ọzọ n'umu-ya, me ya nwa-ọdum.

6. Nwa-ọdum ahu we jegharia n'etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.

7. O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n'efu, site n'olu nke nbib͕ọ-ya.

8. Mba nile we si n'ala nile anāchi achi megide ya buruburu: ha we b͕asa ub͕u-ha n'aru ya; n'olùlù-ha ka anwudere ya.

9. Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel.

10. Nne-gi di ka osisi vine, n'ọbara-gi, n'akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n'ọtutu miri.

11. O we nwe nkpa-n'aka di ike ibu nkpa-n'aka-eze nke ndi nāchi achi, ogologo-ya we di elu rue n'etiti alaka b͕ara ọhia, ewe hu ya n'idi-elu-ya n'iba-uba nke alaka-ya nile.

12. Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.

13. Ma ub͕u a akuwo ya n'ọzara, n'ala kpọrọ nku nke miri nādighi.

14. Ọku we si na nkpa-n'aka nke alaka-ya nile pua, nkpuru-ya ka o ripiaworo, nkpa-n'aka ọ bula nke di ike we ghara idi nime ya ibu nkpa-n'aka-eze ichi achi. Abù-ákwá ka nka bu, o we ghọ abù-ákwá.