isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 8 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-isi, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nānọdu ala n'ulom, mb͕e ndi-okenye Juda nānọdu kwa ala n'irum, na aka Onye-nwe-ayi Jehova dakwasirim n'ebe ahu.

2. M'we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n'ile ya anya; site n'ihe bu úkwù-Ya n'ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n'úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n'ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber.

3. O we setipu udi aka madu, jidem n'agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n'etiti ala na elu-igwe, me ka m'bata Jerusalem n'ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo.

4. Ma, le, n'ebe ahu ka ebube nke Chineke nke Israel di, dika ihe-ọhuhu ahu nke m'huru na ndagwurugwu.

5. O we sim, Nwa nke madu, biko, welie anya-gi le n'uzọ Ugwu. M'we welie anyam abua le n'uzọ Ugwu, ma, le, n'akuku Ugwu nke ọnu-uzọ-ama nke ebe-ichu-àjà ka ihe-oyiyi a nke ekworo di nime nbata.

6. O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n'ebe a, ka M'we si n'ebe nsọm je n'ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche.

7. O we me ka m'biarue ọnu-uzọ ogige ahu; m'we hu, ma, le, otù oghere di na mb͕idi ogige.

8. O we sim, Nwa nke madu, biko, gwue na mb͕idi a: m'we gwue na mb͕idi ahu, ma, le, otù ọnu-uzọ.

9. O we sim, Ba, hu ihe-árú ọjọ nile nke ha onwe-ha nēme n'ebe a.

10. M'we ba, hu; ma, le, udi nile ọ bula nke ihe nākpu akpu, na anumanu nke bu ihe-árú, na arusi nile nke ulo Israel, di, akàra na mb͕idi ahu buruburu n'ebe nile.

11. Ma ọgu ndikom atọ na iri nime ndi-okenye nke ulo Israel nēguzo n'iru ha, Jeazanaia nwa Shefan nēguzo kwa n'etiti ha, onye ọ bula o jide ihe-ya iji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'aka-ya; ísì utọ nke igwe-oji nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure we rigo.

12. O we sim, Nwa nke madu, ì huwo ihe ndi-okenye nke ulo Israel nēme n'ọchichiri, onye ọ bula n'ime-ulo nile nke ihe o mere ka ha yie ihe? n'ihi na ha nāsi, Ọ dighi Jehova nāhu ayi; Jehova arapuwo ala-ayi.

13. O we sim, I gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche nke ha onwe-ha nēme.

14. O we me ka m'biarue oghere ọnu-uzọ-ama nke ulo Jehova nke di n'akuku Ugwu; ma, le, n'ebe ahu ka ndinyom nānọdu ala nākwara Tamuz ákwá.

15. O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? i gāhu kwa ihe-árú ọzọ di iche iche nke di uku kari ndia.

16. O we me ka m'ba nime ogige di nime nke ulo Jehova, ma, le, n'ọnu-uzọ ulo uku nke Jehova, n'etiti uzọ-nbata na ebe-ichu-àjà, ka ihe ra ka orú ndikom na ise nọ, b͕akuta ulo uku nke Jehova azu-ha, che iru-ha n'akuku Iru-anyanwu; ndi ahu nākpọ kwa isi ala nye anyanwu che Iru-anyanwu iru.

17. O we sim, Ì huwo, nwa nke madu? Ọ̀ buru ulo Juda ihe di nfe ime ihe-árú nile nke ha meworo n'ebe a? n'ihi na ha emejuwo ala-ha n'ihe-ike, we chigharia ikpasum iwe; ma, le, ha nēsetipu alaka rue imi-ha.

18. Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n'ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n'oké olu, ma M'gaghi-anu olu-ha.