isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 6 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we ruem nti, si,

2. Nwa nke madu, che iru-gi n'ugwu nile nke Israel, bu amuma megide ha,

3. si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile: Le, Mu onwem nēme ka mma-agha biakwasi unu, M'gēme kwa ka ha la n'iyì, bú ebe nile unu nke di elu.

4. Agēme kwa ka ebe-ichu-àjà nile unu tọb͕ọrọ n'efu, agētipia kwa arusi-anyanwu nile unu: M'gēme kwa ka ndi-unu eb͕uru eb͕u da n'iru arusi nile unu.

5. M'gātọb͕ọ kwa ozu nile nke umu Israel n'iru arusi nile ha; M'gātusa kwa ọkpukpu-unu buruburu ebe-ichu-àjà nile unu.

6. N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.

7. Onye eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti unu, unu we mara na Mu onwem bu Jehova.

8. Ma M'gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n'etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n'ala nile.

9. Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.

10. Ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: ọ bughi n'efu ka M'kwuworo okwu, si na M'gēme ha ihe ọjọ a.

11. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n'ala, si, Éwù! n'ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n'ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n'oké unwu, site kwa n'ajọ ọria nke nēfe efe, da.

12. Onye nọ n'ebe di anya gēsite n'ajọ ọria nēfe efe nwua; onye nọ nso gēsite na mma-agha da; onye fọduru nke anānọchigide kwa n'agha gēsite n'oké unwu nwua: M'we mezue ọnumam n'aru ha.

13. Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n'etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n'ugwu ntà ọ bula di elu, na n'elu ugwu nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, na n'okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ.

14. M'gēseti kwa akam n'aru ha, me ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, site n'ọzara rue Dibla, n'ebe-obibi nile ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.