isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 54 Bible Nso (IGBOB)

1. Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.

2. Me ka ebe ulo-ikwū-gi sa mbara, ka ha seti kwa ákwà-nkwuba nile nke ebe-obibi-gi nile; eb͕ochila: me ka udọ̀-gi nile di ogologo, me kwa ka ǹtú-gi nile di ike.

3. N'ihi na n'aka-nri na n'aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n'efu ka ha gēme ka madu biri nime ha.

4. Atula egwu; n'ihi na ihere agaghi-eme gi: ka aghara itiye kwa gi n'ọnọdu-ihere; n'ihi na agaghi-eme gi ka i nwe iru-ihere: n'ihi na i gēchezọ ihere nke mb͕e i nọ na nwata, ọzọ, ita-uta nke ọnọdu nwayi di-ya nwuru i nọ, i gaghi-echeta ya ọzọ.

5. N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.

6. N'ihi na Jehova akpọwo gi dika nwanyi arapuru arapu nke o nēwuta kwa ya nime mọ-ya, bú nwunye alutara na nwata, mb͕e ajuru ya, ka Chineke-gi siri.

7. N'otù ntabi-anya di ntà ka M'rapuworo gi arapu; ma obi-ebere nile di uku ka M'gēji chikọta gi.

8. Na nrubiga-ókè nke iwe ka M'zonariri gi irum otù ntabi-anya; ma ebere ebighi-ebi ka M'gēji nwe obi-ebere n'aru gi, ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa-gi, siri.

9. N'ihi na otú miri nke Noa ka nka dirim: n'ihi na dika M'ṅuru iyi, si na miri nke Noa agaghi-erubiga kwa uwa ọzọ, otú a ka M'ṅuworo iyi, si na M'gaghi-ewesa gi iwe, na M'gaghi-abasiri gi nba ike.

10. N'ihi na ugwu nile gāpu n'ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n'ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n'ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n'ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n'aru gi siri, bú Jehova.

11. Gi nwanyi ewedara n'ala, nke oké ifufe nēfeghari, nke anākasighi obi, le, Mu onwem gēdo nkume-gi nile n'ihe-ichọ-nma, were nkume sapphire tọ ntọ-ala-gi.

12. M'gēme kwa ka elu akuku ulo-gi nile ghọ nkume ruby, me kwa ka ọnu-uzọ-ama-gi nile ghọ nkume carbuncle, me kwa ka ókè-ala-gi nile ghọ nkume di iche iche anāchọsi ike.

13. Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.

14. N'ezi omume ka agēme ka i guzosie ike: gi nọpu nmeb͕u n'ebe di anya, n'ihi na i gaghi-atu egwu; nọpu kwa ihe-ujọ n'ebe di anya, n'ihi na ọ gaghi-abiaru gi nso.

15. Le, ọ buru na onye ọ bula akpalie ise-okwu megide gi, o siteghi na Mu: onye ọ bula nke kpaliworo ise-okwu n'ebe i nọ gāda ada n'ihi gi.

16. Le, Mu onwem ekèwo uzú nke nāfù ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi.

17. Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.