isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 21 Bible Nso (IGBOB)

1. Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.

2. Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.

3. N'ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m'nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m'we ghara inu ihe; amaram jijiji, m'we ghara ihu uzọ.

4. Obim akpafuwo, oké ọma-jijiji emewo ka m'tua egwu nke-uku: chi-ojiji nke dim ezi nma ka o meworo ka ọ ghọrọm ima-jijiji.

5. Ha nēdozi table, che nche, rie ihe, ṅua ihe-ọṅuṅu: bilienu, ndi-isi, tenu ọta manu.

6. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Je, guzo onye-nche: ihe ọ gāhu ka ọ gēgosi:

7. ma ọ buru na ọ hu usu madu, ndi-inyinya nēje abua abua, usu inyinya-ibu, usu camel, ọ gāṅa nti nāṅasi nti ike nke-uku.

8. O we kpọ dika ọdum: si, Onye-nwe-ayi, n'elu ulo-nche ka mu onwem nēguzo mb͕e nile n'ehihie, na nchem ka anēme ka mu onwem guzo n'abali nile:

9. ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.

10. Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.

11. Ibu eboro Duma.Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali?

12. Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.

13. Ibu ebero Arebia.N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.

14. Izute onye akpiri nākpọ nku kutanu miri; unu ndi bi n'ala Tima, werenu nri kwesiri ya zute onye nāwaghari.

15. N'ihi na n'iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n'iru mma-agha amiputara amiputa, na n'iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n'iru ibu di arọ́ agha bu.

16. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi: