isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 62 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi Zaion m'gaghi-edebe ọnum du, na n'ihi Jerusalem m'gaghi-anọ jū, rue mb͕e ezi omume-ya gāputa ihè dika onwu-maramara, nzọputa-ya kwa dika ọwa nke nēnwu enwu.

2. Mba di iche iche gāhu kwa ezi omume-gi, eze nile gāhu nsọpuru-gi: agākpọ kwa gi aha ọhu nke ọnu Jehova gāgu.

3. I gāghọ kwa okpu-eze nke ima-nma n'aka Jehova, na ákwà-ike-n'isi nke ala-eze n'ọbu-aka Chineke-gi.

4. Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.

5. N'ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n'aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n'aru gi.

6. N'elu mb͕idi-gi nile, Jerusalem, ka M'doworo ndi-nche; ogologo ubọchi nile ehihie na abali, mb͕e nile, ha agaghi-edebe ọnu-ha du: unu ndi nēchetara Jehova ihe, unu ederela du,

7. unu ekwe-kwa-la ka O dere du, rue mb͕e Ọ gēme ka Jerusalem guzosie ike, ru kwa mb͕e Ọ gēme ya ka ọ buru otuto n'uwa.

8. Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N'ezie M'gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n'ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu bayere ya:

9. kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.

10. Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche.

11. Le, Jehova emewo ka anuru ya rue nsọtu uwa, si, Sinu ada Zaion, Le, nzọputa-gi abiawo; le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya.

12. Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.