isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 27 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.

2. N'ubọchi ahu: Otù ubi-vine nke manya-vine nāsu ufufu, tienu nkpu ọṅù bayere ya.

3. Mu onwem, Jehova, bu onye-nche-ya; na mb͕e nile ọ bula dikasiri ntà ka M'nēdè ya miri: ka onye ọ bula we ghara iji ihe ọjọ leta ya, abali na ehihie ka M'nēche ya.

4. Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n'agha! M'gāwaku ha, M'gēsurekọta ha n'otù.

5. Ma-ọbu, ya jide ebem siri ike, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo; e, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo.

6. N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume.

7. Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?

8. N'ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n'ubọchi ifufe Iru-anyanwu.

9. N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.

10. N'ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n'ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile.

11. Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.

12. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gētichapu nkpuru-ọka-Ya, site na miri nērù ọku ọku nke Osimiri rue miri-iyi Ijipt, ewe chikọta unu onwe-unu n'otù n'otù, unu umu Israel.