isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 37 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e eze, bú Hezekaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova.

2. Ọ we zìe Elaiakim, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na ndi okenye ndi-nchu-àjà, ndi wereworo ákwà-nkpe kpuchie onwe-ha, o we zìe ha jekuru Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma.

3. Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.

4. Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.

5. Ndi-orù eze, bú Hezekaia, we biakute Aisaia.

6. Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum.

7. Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; m'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya.

8. Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka ọ nēbuso Libna agha: n'ihi na O nuru na o siwo na Lekish bulie ije.

9. Ọ we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Ọ putawo ibuso gi agha. O we nu, zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia, si,

10. Otú a ka unu gāgwa Hezekaia bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si, Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria.

11. Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?

12. chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa?

13. Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?

14. Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ya: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova.

15. Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si,

16. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.

17. Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke zitere madu ita Chineke di ndu uta.

18. N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka ala nile na ala-ha tọb͕ọrọ n'efu,

19. ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.

20. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi.

21. Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.

22. Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi.

23. Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.

24. I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.

25. Mu onwem egwuwo olùlù-miri, ṅua miri, m'gēwere kwa ọbu-ukwu nke nzọli-ukwum me ka osimiri Nail nile nke Ijipt tasia.

26. Ì nughi na ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka M'meworo ya, na ọ bu site n'ubọchi mb͕e ochie ka M'kpuworo ya? ugbu a emewom ka ọ biarue, na i gābu onye gākwada obodo ewusiri ike ka ha we ghọ obo tọb͕ọrọ n'efu.

27. Ndi bi nime ha we ghọ ndi aka-ha di nkpunkpu, ha turu ujọ, ihere we me ha; ha ghọrọ ihe-ọkukú nke ubi, na akwukwọ ahihia ndu, na ahihia nke elu-ulo, na ubi ọka tutu o tolite.

28. Ma amowom nnọdu-gi, na ọpupu-gi, na nbata-gi, na otú i nākpali onwe-gi imegidem.

29. N'ihi na i nākpali onwe-gi imegidem, na n'ihi na npako-gi arigowo ba na ntim abua, M'gētiye kwa nb͕a-aka-imim n'imi-gi, na bridle nkem n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua, me ka i laghachi n'uzọ ahu nke i siri bia.

30. Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpú n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-otọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.

31. Ndi b͕apuru ab͕apu nke ulo Juda ndi fọduru gāb͕agide kwa nkpọrọgwu n'ala n'okpuru ọzọ, mi kwa nkpuru n'elu.

32. N'ihi na ọ bu na Jerusalem ka ndi fọduru afọdu gēsi puta, ndi b͕apuru ab͕apu gāputa kwa n'ugwu Zaion: ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.

33. N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a otù àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.

34. N'uzọ o siri bia, n'uzọ ahu ka ọ gālaghachi, ọ gaghi-abà kwa n'obodo a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

35. M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.

36. Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.

37. Senakerib, bú eze Asiria, we bulie ije, je, laghachi, biri na Nineve.

38. O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.