isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 18 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri ala ùzù nke ọtutu nkù, nke di n'ofè osimiri nile nke Etiopia:

2. nke nēziga ndi-ukọ̀ n'oké osimiri, ọbuná n'ub͕ọ papyrus di iche iche n'elu miri! Unu ndi-ozi nkọ, jekurunu otù mba ndi di ogologo di kwa lari n'aru, rue otù ndi di egwu site na nmalite-ya ga n'iru; bú mba nātùta atùta nāzọda kwa azọda, nke osimiri di iche iche kewaworo ala-ya!

3. Unu ndi nile nēbi n'elu-uwa dum madu bi, na unu ndi nwere ebe-obibi-unu n'uwa, mb͕e anēbuli ọkọlọtọ n'elu ugwu nile, hunu; ọzọ mb͕e anāfù opi-ike, nurunu,

4. N'ihi na otú a ka Jehova siworom, M'gānọ jū, M'gēlegíde kwa anya n'ebem guzosiri ike; dika okpom-ọku nēnwu enwu n'ìhè anyanwu, dika alulu igirigi n'okpom-ọku nke owuwe-ihe-ubi.

5. N'ihi na tutu owuwe-ihe-ubi erue, mb͕e ifuru zusiri okè, na mb͕e okoko nāghọ nkpuru-vine nāchaghi acha, O gēji mma-nkwacha bipu umu-alaka-ya, ọ bu kwa alaka-ya nile ka Ọ gēwezuga b͕uchapu.

6. Agārapu ha n'otù nye udele nke ugwu, nye kwa anu-ọhia nke uwa: udele gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e okpom-ọku, anu-ọhia nke uwa gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e oyi.