isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 25 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, Chinekem ka I bu; m'gēme ka I di elu, m'gēkele aha-Gi; n'ihi na I mewo ihe-ebube, bú ndum-ọdu di iche iche site na mb͕e di anya gara aga, n'ikwesi-ntukwasi-obi na ezi-okwu.

2. N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.

3. N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.

4. N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.

5. Dika okpom-ọku n'ebe kpọrọ nku, otú a ka I gēme ka nkpọtu nke ndi ala ọzọ darue ala; dika okpom-ọku site na ǹdò nke igwe-oji, otú a ka agēweda abú ọma nke ndi nēme ka madu ma jijiji.

6. Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.

7. Ọzọ, n'ugwu a ka Ọ gēloda iru ihe-nfuchi ahu eji afuchi ndi nile di iche iche, na ihe-nkpuchi ahu eji ekpuchi mba nile.

8. O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.

9. Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.

10. N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.

11. Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n'etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua.

12. Ọzọ, ebe ewusiri ike nke ulo-elu nke mb͕idi-gi nile ka O budaworo, me ka ọ di ala, me ka ọ darue ala, ọbuná rue ájá.