isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù.Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n'elu ulo nile, ka i ra?

2. Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n'agha.

3. Ndi-ọchi-agha-gi nile ab͕apuwo n'otù, ekere ha ab͕u n'enweghi uta: ndi-gi nile achọtaworo, ekere ha ab͕u n'otù, rue ebe di anya ka ha b͕alagara.

4. N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.

5. N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu.

6. Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.

7. O rue, na ndagwurugwu-gi nile arọputara arọputa juputara n'ub͕ọ-ala, ndi-inyinya do-kwa-ra onwe-ha n'usoro n'iru ọnu-uzọ-ama.

8. O we kpughepu ihe-nkwuchi nke Juda; i we legide ihe-agha di n'ulo oké ọhia anya n'ubọchi ahu.

9. Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n'okpuru.

10. Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike.

11. Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n'etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n'ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya.

12. Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu:

13. ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.

14. Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.

15. Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Je, bakuru odozi-àkù a, bú Shebna, nke bu onye-isi ulo, si,

16. Gini ka i nwere n'ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n'ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n'ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n'elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu!

17. Le, Jehova gaje itudasi gi ike, gi nwoke; e, Ọ gaje ipiakọta gi apiakọta.

18. Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi!

19. M'gākwapu kwa gi n'ebe-nguzo-gi siri ike, o gēsi kwa n'ọnọdu-gi dọda gi.

20. Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gākpọ orùm. bú Elaiakim nwa Hilkaia:

21. M'gēyikwasi ya uwe-gi, were ihe ahu anēke gi n'úkwù kesie ya ike, ọ bu kwa ọchichi-gi ka M'gēnye ya n'aka: ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem na ndi ulo Juda nna.

22. M'gātukwasi kwa nkpisi-ugodi ulo Devid n'ubu-ya; o we meghe, ọ dighi kwa onye nēmechi; o we mechie, ọ dighi kwa onye nēmeghe.

23. M'gākpọgide kwa ya dika ǹtú n'ebe kwesiri ntukwasi-obi; ọ gāghọ-kwa-ra ulo nna-ya oche-eze nsọpuru.

24. Ha gēkokwasi kwa ya nsọpuru nile nke ulo nna-ya, umu-ya na umu-nna-ya, ihe nile nke di ntà, site n'ihe nile bu ọkwa we rue ihe nile bu karama.