isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50
  51. 51
  52. 52
  53. 53
  54. 54
  55. 55
  56. 56
  57. 57
  58. 58
  59. 59
  60. 60
  61. 61
  62. 62
  63. 63
  64. 64
  65. 65
  66. 66

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Aisaia 31 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!

2. Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe.

3. Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi.

4. N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.

5. Dika umu-nnunu nēfe efe, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi Jerusalem; nēb͕ochi nānaputa; nāgabiga nēme ya ka o wepuga onwe-ya.

6. Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.

7. N'ihi na n'ubọchi ahu ha gāju, onye ọ bula ọ ju ihe-efu ọla-ọcha ya nile na ihe-efu ọla-edo ya nile, nke aka-unu mere nye onwe-unu, ibu nmehie.

8. Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.