isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 19 Bible Nso (IGBOB)

1. O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus:

2. o we si ha, Ùnu natara Mọ Nsọ mb͕e unu kwere? Ha si ya, É-è, kama ayi anughi ọbuná ma enyere Mọ Nsọ.

3. O we si, Ọ̀ bu ibà nime gini kwa ka emere unu baptism? Ha we si, Ibà nime baptism nke Jọn.

4. Pọl we si, Jọn ji baptism nke nchèghari eme baptism, nāsi ndi-Ju ka ha kwere n'Onye ahu Nke gaje ibia n'azu ya, nke ahu bu, na Jisus.

5. Mb͕e ha nuru nka, ewe me ha baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus.

6. Mb͕e Pọl bikwasisiri ha aka-ya abua n'isi, Mọ Nsọ we biakwasi ha; ha we kwue okwu n'asusu di iche iche ọzọ, bu kwa amuma.

7. Ha nile ra ka ndikom iri na abua.

8. O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.

9. Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs.

10. Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.

11. Chineke nālu kwa ọlu di ike site n'aka Pọl dika anāhughi mb͕e ọ bula:

12. ya mere anēsi n'aru-ya wetara ndi aru-ha nādighi ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n'aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa.

13. Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.

14. Umu-ndikom asa nke otù onye-Ju, anākpọ Skiva, bú onye-isi-nchu-àjà, di, ndi mere nka.

15. Ajọ mọ ahu we za, si ha, Jisus ka m'matara, ama-kwa-ram Pọl; ma ùnu onwe-unu bu ole ndi?

16. Nwoke ahu onye ajọ mọ di nime ya we wukwasi ha, karia ha abua, o nwe-kwa-ra ike n'aru-ha, ya mere ha si n'ulo ahu b͕apu, b͕ara ọtọ, emeru kwa ha aru.

17. Ewe me ka ndi nile ndi bi n'Efesọs, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, mara nka; ha nile we tua egwu, eme-kwa-ra aha Onye-nwe-ayi Jisus ka ọ di uku.

18. Ọtutu madu n'etiti ndi kwereri na Jisus bia-kwa-ra, nēkwuputa, nākọ kwa ihe nile ha nēme.

19. Ọ dighi kwa madu ole-na-ole n'etiti ndi nēme mb͕asi kpokọtara akwukwọ-ha, rechapu ha ọku n'iru ọra madu: ha we gua ọnu-ahia-ha, we hu na ọ bu ọgu nnù ego ọla-ọcha isi na nnù ise.

20. Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.

21. Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.

22. Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.

23. Ma ihe di ka oge ahu ọ bughi nkpasu ntà putara bayere Uzọ Jisus.

24. N'ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà;

25. ndi ọ kpọkọrọ, ha na ndi nālu ọlu di otú ahu, we si, Ndikom, unu mara na ayi nwere àkù-ayi site n'ọlu a.

26. Ma unu nāhu nānu kwa, na ọ bughi nání n'Efesọs kama ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru n'Esia nile, ka Pọl nka rafuru oké ìgwè madu wepu kwa ha n'ezi uzọ, ebe ọ nāsi na ihe eji aka me abughi chi:

27. ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.

28. Mb͕e ha nuru nka, ha we juputa n'ọnuma, ti kwa nkpu, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.

29. Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije.

30. Ma mb͕e Pọl zubere ibakuru ọra madu ahu, ndi nēso uzọ Jisus ekweghi ya.

31. Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe.

32. Ya mere ufọdu nēti nkpu otù ihe, ufọdu nēti kwa ihe ọzọ: n'ihi na nzukọ ahu nāb͕a aghara; ndi kariri n'ọnu-ọgugu n'etiti ha amataghi kwa ihe ha jiri zukọ.

33. Ha we si n'etiti ìgwè madu ahu nupu Aleksanda, ebe ndi-Ju nēnu ya ka o buru uzọ. Aleksanda we kpukpue ha aka, nāchọ ka ọ gọpuru ọra madu onwe-ya.

34. Ma mb͕e ha mazuru na ọ bu onye-Ju, ha nile were otù olu nēti nkpu ihe ra ka oge hour abua, si, Daiana nke ndi Efesọs di uku.

35. Ma mb͕e ode-akwukwọ-ha mesiri ka ìgwè madu ahu jurú, ọ si, Ndikom Efesọs, Ònye di n'etiti madu nke nāmaghi na obodo ndi Efesọs bu odozi-ulo-nsọ, oké Daiana ahu, na nke arusi nke si n'elu-igwe da?

36. Ya mere ebe anāpughi irughari ihe ndia uka, unu aghaghi ijurú, na ighara ime ihe nēchèghi echè.

37. N'ihi na unu kutara ndikom ndia n'ebe a, ndi nābughi ndi nēzu ihe ulo chi n'ori ma-ọbu ndi nēkwulu chi-nwanyi nke ayi.

38. Ya mere ọ buru na Dimitriọs, na ndi-ọ̀kà ndi soro ya, nwere okwu megide onye ọ bula, anēdebe ubọchi ikpé, ndi-isi nọ kwa: ka ha borita onwe-ha ebubo.

39. Ma ọ buru na unu nāchọ ihe ọ bula bayere okwu di iche, agēdozi ya na nzukọ ahu nke ziri ezi n'iwu.

40. N'ihi na ayi nọ n'ihe-ize-ndu na agēji ihe mere ta bo ayi ebubo na ayi biliri megide ndi-isi, ebe ọ nādighi ihe wetara ya: n'ihi ya ayi agaghi-apu kwa iza ajuju bayere nb͕akọ a.

41. Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o we zilaga nzukọ ahu.