isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 20 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia.

2. Mb͕e ọ gabigasiri n'akuku ahu nile, were kwa ọtutu okwu kasie ha obi, ọ bia na Gris.

3. Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n'ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi.

4. Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia.

5. Ma ndia bururi uzọ je, we nēche ayi na Troas.

6. Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n'ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa.

7. N'ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa, mb͕e ayi zukọrọ inyawa achicha, Pọl we gwa ha okwu, ebe ọ gaje ila echi-ya; o we kwugide okwu rue etiti abali.

8. Ọtutu ọku-ọwa di kwa n'ime-ulo nke di n'elu ulo, ebe ayi zukọrọ.

9. Ma otù okorọbia, aha-ya bu Yutikọs, nānọdu na window, onye oké ura nākwada; mb͕e Pọl nēkwu okwu rue oge dikari anya, ebe ura-ya kwadara ya o we si n'ulo elu nke-atọ di n'ulo ahu da n'ala, o mewo ozu mb͕e ha buliri ya.

10. Ma Pọl ridara, dakwasi ya, makua ya, si, Unu atula ùzù; n'ihi na ndu-ya di nime ya.

11. Mb͕e ọ rigosiri, nyawa achicha, ri kwa, mb͕e ya na ha kparitasi-kwa-ra ogologo oge, ọbuná rue chi-ọbubọ, o we pua otú a.

12. Ha we kuta nwa-okoro ahu na ndu, ọ bughi kwa nkasi-obi ntà akasiri ha.

13. Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala.

14. Mb͕e o zutere ayi n'Asọs, ayi were ya n'ub͕ọ, we bia rue Mitilini.

15. Ayi we si n'ebe ahu ga, we rue na ncherita-iru Kaiọs n'ubọchi soni; ubọchi so ya ayi we rue ala na Samọs, we chere oge ufọdu na Trogilium; ubọchi soni ayi we bia rue Militọs.

16. N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya.

17. O we si na Militọs ziga n'Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya.

18. Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha,Unu onwe-unu mara, site n'ubọchi mbu m'zọrọ ukwu n'Esia, otú m'nọ n'etiti unu oge ahu nile,

19. otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:

20. otú egwu nēmeghm ka m'ghara ikọrọ unu otù ihe n'ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n'iru ọra madu, n'ulo nke aka unu kwa n'otù n'otù,

21. nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ.

22. Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu:

23. ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n'obodo nile n'otù n'otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem.

24. Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.

25. Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m'jeghariri n'etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ.

26. N'ihi ya agwasim unu ike ubọchi ta, na adim ọcha n'ebe ọbara madu nile di.

27. N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.

28. Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n'etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya.

29. Mu onwem matara na mb͕e m'lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n'etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere;

30. ndikom gēsite kwa n'etiti unu onwe-unu bilie, nēkwu ihe di iche iche nēduhie madu uzọ, ka ha dọpu ndi nēso uzọ Jisus iso ha n'azu.

31. N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie.

32. Ub͕u a ararakwam unu nye n'aka Chineke na aka okwu amara-Ya, nke puru iwuli unu elu dika ulo, na inye unu ihe-nketa ahu n'etiti ndi nile edoworo nsọ.

33. Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm.

34. Unu onwe-unu mara na akam ndia nālutara mu onwem na ndi mu na ha nọ ihe nākpà mu na ha.

35. N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.

36. Mb͕e o kwusiri ihe ndia, o b͕ue ikperè n'ala, ya na ha nile kpere Chineke.

37. Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n'olu, sutu kwa ya ọnu,

38. ihe nēb͕u ha nb͕u kari ihe nile bu okwu nke o kwururi, na ha agaghi-ahu iru-ya ọzọ. Ha we dupu ya n'ije-ya rue mb͕e ọ batara n'ub͕ọ.