isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ubọchi Pentikọst nēzu okè, ha nile we nọkọ n'otù ebe.

2. Na mberede ùzù, dika nke oké ifufe nke nēfesi ike, we site n'elu-igwe, o we juputa ulo ahu dum ebe ha nānọdu ala.

3. Ewe me ka ha hu ire, dika nke ọku, nēkesa onwe-ha; o we nọkwasi ha nile n'otù n'otù.

4. Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.

5. Ma ndi-Ju ufọdu bi na Jerusalem, ndi nātu egwu Chineke, ndi si na mba nile di n'okpuru elu-igwe bia.

6. Ma mb͕e ùzù ahu putura, ọra madu b͕akọrọ, o we b͕a ha ghari, n'ihi na onye ọ bula n'etiti ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu nke aka ya.

7. Ibobo we nwua ha nile n'aru, o ju-kwa-ra ha anya, ha si, Le, ndia nile ndi nēkwu okwu, hà abughi ndi Galili?

8. Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya?

9. Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,

10. nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju,

11. ndi Krit na ndi Arebia, ayi nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu-ayi bayere oké ọlu nile nke Chineke.

12. Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha nwe-kwa-ra obi abua, nāsirita ibe-ha, Isi ihe a bu gini?

13. Ma ndi ọzọ nēme ha ihe-ọchì, si, Ha ṅujuworo manya-vine ọchu afọ.

14. Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum.

15. N'ihi na manya abàghi ndia n'anya, dika unu onwe-unu nēchè; ebe ọ bu oge hour nke-atọ n'ututu;

16. kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si,

17. Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru,M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu:Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma,Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù,Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

18. E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyomKa M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.

19. M'gēnye kwa ọlu-ebube n'elu-igwe di n'elu,Na ihe-iriba-ama n'elu ala di n'okpuru ya;Ọbara, na ọku, na alulu anwuru-ọku:

20. Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri,Ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara,Tutu ubọchi Onye-nwe-ayi abia,Bú oké ubọchi ahu nke nāputa ìhè:

21. O gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Onye-nwe-ayi, agāzọputa ya.

22. Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:

23. Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:

24. Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya.

25. N'ihi na Devid nēkwu okwu bayere Ya, si,Anamahuri Onye-nwe-ayi n'irum mb͕e nile;N'ihi na Ọ nọ n'aka-nrim, ka aghara ime ka M'me nkpatu:

26. N'ihi nka ọ tọrọ obim utọ, obi nātọ kwa irem utọ nke-uku;Ọzọ kwa, anu-arum gēbi kwa n'olile-anya:

27. N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis,I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.

28. I mere ka M'mara uzọ ndu;I gēji iru-Gi me ka M'juputa n'ọṅù.

29. Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta.

30. Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya;

31. ebe o buru uzọ hu nka a o kwuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke Kraist ahu, na arapughi Ya nime Hedis, anu-aru-Ya ahughi kwa ire-uré.

32. Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya.

33. Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.

34. N'ihi na Devid arigoghi n'elu-igwe: ma ya onwe-ya si,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,

35. Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi nke ukwu-Gi abua.

36. Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.

37. Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?

38. Pita we si ha, Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptism n'otù n'otù n'aha Jisus Kraist, ka ewe b͕aghara nmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a, bú Mọ Nsọ.

39. N'ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n'ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chinike-ayi gākpọtara Onwe-ya.

40. O ji kwa ọtutu okwu ọzọ kwusie okwu ike, nāriọ kwa ha, si, Zọputanu onwe-unu n'ọb͕ọ a di nb͕agọ.

41. Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.

42. Ha we nānọgidesi ike n'ozizí ndi-ozi na nnwekọ, n'inyawa-achicha-ha na ekpere-ha.

43. Madu nile we tua egwu n'otù n'otù: eme-kwa-ra ọtutu ọlu-ebube na ihe-iriba-ama site n'aka ndi-ozi.

44. Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile;

45. ha we re ihe nile ha natara na ihe nile ha nwere, we kesa ha nye madu nile, dika nkpà diri onye ọ bula.

46. Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,

47. ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.