isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọlu Ndi-Ozi 23 Bible Nso (IGBOB)

1. Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta.

2. Onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we gwa ndi guzoro ya nso ka ha tie ya aka n'ọnu.

3. Mb͕e ahu Pọl siri ya, Chineke gaje iti gi aka, gi mb͕idi etere nzu: gì onwe-gi nānọdu kwa ala ikpem ikpé dika iwu-ayi si di, i we kwue ka etiem aka n'uzọ megidere iwu ahu?

4. Ndi guzoro nso we si, Ì nēkwutọ onye-isi-nchu-àjà nke Chineke?

5. Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi.

6. Ma mb͕e Pọl matara na otù uzọ nime ha bu ndi-Sadusi, ma uzọ nke-ọzọ bu ndi-Farisi, o tiri nkpu nime nnọkọ-ikpe ahu, si, Umu-nnem, mu onwem bu onye-Farisi, nwa ndi-Farisi: anēkpe mu onwem ikpé bayere olile-anya na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu.

7. Mb͕e o kwusiri okwu a, esem-okwu we puta n'etiti ndi-Farisi na ndi-Sadusi: ọra ndi ahu we kewa.

8. N'ihi na ndi-Sadusi nāsi na nbilite-n'ọnwu, ma-ọbu mọ-ozi, ma-ọbu mọ, adigh: ma ndi-Farisi nēkwuputa ha abua.

9. Oké iti-nkpu we puta: ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ ndi di n'akuku ndi-Farisi we guzo ọtọ, lu kwa ọ̀gù, si, Ayi ahughi ihe ọjọ n'aru nwoke a: ma gini kwa ma ọ buru na mọ ma-ọbu mọ-ozi gwara ya okwu?

10. Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n'ike n'etiti ha, kuta ya n'ulo ndi-agha.

11. Ma n'abali soni Onye-nwe-ayi guzoro n'akuku ya, si, Nwe obi-ike: n'ihi na dika i kwuru okwu bayerem si-ike na Jerusalem, i ghaghi ib͕a kwa àmà otú a na Rom.

12. Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl.

13. Ndi ṅukọrọ iyi a kariri ọgu ndikom abua.

14. Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl.

15. Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso.

16. Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n'ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl.

17. Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n'ihi na o nwere ihe ikọrọ ya.

18. Ya mere o kuru ya, duru ya jekuru onye-isi-ọchi-agha, si, Pọl onye-nkpọrọ kpọrọm jekuru ya, we kperem ka m'dutara gi okorọbia nka, ebe ọ nwere okwu igwa gi.

19. Onye-isi-ọchi-agha we jide ya n'aka, wezuga onwe-ya we jua ya iche, si Gini bu ihe i nwere ikọrọm?

20. Ọ si, Ndi-Ju kwekọrọ ọnu ikpere gi ka i kuda Pọl echi jekuru nnọkọ-ikpé-ha, dika i gaje ijuta ihe bayere ya nke-ọma kari.

21. Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha.

22. Ya mere onye-isi-ọchi-agha zilagara nwa-okorọbia ahu, nēnye ya iwu, si, Agwala onye ọ bula na i gosirim ihe ndia.

23. O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali:

24. ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n'elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi.

25. O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka:

26. Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya.

27. Ndi-Ju jidere nwoke a, ha gaje kwa ib͕u ya, mb͕e mu na ndi-agha biakwasiri ha, weputa ya n'aka-ha, ebe m'nutasiri na ọ bu onye Rom.

28. Ebe m'zubere imazu ihe mere ha ji bo ya ebubo, m'we kudata ya na nnọkọ-ikpé-ha:

29. onye m'huru na anēbo ya ebubo bayere ajuju di iche iche nke iwu-ha, ma o nweghi ihe eboro ya kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.

30. Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m'we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n'iru gi.

31. Ya mere ndi-agha, dika akara ha àkà, were Pọl, kuru ya rue Antipatris n'abali.

32. Ma n'echi-ya ha rapuru ndi-inyinya ka ha so ya je, ha we laghachi n'ulo ndi-agha:

33. mb͕e ndi ahu biaruru Sisaria, nye kwa onye-isi akwukwọ-ozi ahu, ha we che kwa Pọl n'iru ya.

34. Mb͕e ọ gusiri ya, ọ jua ajuju ala o si puta; mb͕e ọ jutara na ọ bu onye Silisia,

35. ọ si, M'gānuzu okwu-gi mb͕e ọ bula ndi boro gi ebubo gēru kwa ebe a: o we nye iwu ka edebe ya na Pritoriọm nke Herod.