N'ihi na otù nwoke, aha-ya bu Dimitriọs, bú uzú ọla-ọcha, onye nākpu ulo nsọ ntà nke ọla-ọcha nke Daiana, ọ bughi ọlu ntà ka onye ahu nēwetara ndi-ọ̀kà;