isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 24 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n'anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n'ọzara.

2. Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.

3. Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

4. Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

5. Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!

6. Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri,Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,Dika osisi cedar n'akuku miri.

7. Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa,Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri,Eze-ya gādi kwa elu kari Egag,Agēbuli kwa ala-eze-ya.

8. Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta;Ume dika ume atu ka ọ nwere:O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya,Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha,Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.

9. Ọ makpuru, o dinara dika ọdum,Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?Onye ọ bula nke nāgọzi gi bu onye agọziri agọzi,Onye ọ bula nke nābu gi ọnu bu kwa onye anābu ọnu.

10. Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.

11. Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru.

12. Belam we si Belak, Ọ̀ bughi kwa ndi-ozi-gi, bú ndi i ziterem, ka m'gwara okwu, si,

13. Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?

14. Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.

15. Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

16. Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāma kwa ihe-ọmuma nke Onye kachasi ihe nile elu,Ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile ka ọ nāhu,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

17. Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a:Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso:Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije,Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie,We mapue akuku nile nke Moab,Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,

18. Edom gābu kwa ihe-nnweta,Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya;Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.

19. Otù onye gēsi kwa na Jekob zọda mba nile,Ọ geme kwa ka ndi foduru si n'obodo lapu n'iyì.

20. Ọ we hu Amalek, we tua ilu-ya, si,Mba mbu nke mba nile ka Amalek bu;Ma ikpe-azu-ya gābiaru ila-n'iyì.

21. Ọ we hu ndi-Kinait, we tua ilu-ya, si,Ebe nke nādigide adigide ka ebe-obibi-gi di,Etiye-kwa-ra akwu-gi na nkume di elu.

22. Ma otú ọ di, Ken gābu ihe irechapu ọku,Rùe ole mb͕e? Asiria gādọta gi n'agha.

23. Ọ we tua ilu-ya, si,Ewū! ònye gādi ndu site na mb͕e Chineke nēdo ya?

24. Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia,Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala,Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.