isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 36 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi-isi nke ndi bu nna nke ab͕uru umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase, n'etiti ab͕uru umu Josef, we biarue nso, kwue okwu n'iru Moses, na n'iru ndi-isi, bú ndi-isi nke ndi bu nna nke umu Israel:

2. ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n'ihe-nketa n'ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n'ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom.

3. Ma asi na ha gāghọrọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu ebo ọzọ nke umu Israel nwunye, agāgupu kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke nna-ayi-hà, tukwasi ya n'ihe-nketa ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ya n'ihe ife-nzà nke ihe-nketa-ayi.

4. Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n'ihe-nketa ebo nna-ayi-hà.

5. Moses we nye umu Israel iwu n'okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu.

6. Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n'anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye.

7. Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu: n'ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa ebo nna-ya-hà.

8. Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n'ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n'ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà.

9. Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu; n'ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa nke aka ya.

10. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere:

11. Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha.

12. Ọ bu ndikom nke sitere n'ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n'ebo nke ab͕uru nna-ha.

13. Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.