isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 34 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)

3. akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu:

4. ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:

5. ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.

6. Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu

7. Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n'oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa:

8. unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:

9. ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu.

10. Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:

11. ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:

12. ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.

13. Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:

14. n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;

15. ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.

16. Jehova we gwa Moses okwu, si,

17. Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.

18. Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.

19. Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.

20. Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.

21. Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.

22. Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.

23. Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod:

24. nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan.

25. Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak.

26. Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan.

27. Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi.

28. Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud.

29. Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n'ala Kenean.