1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)
3. akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu:
4. ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:
5. ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.
6. Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu
7. Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n'oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa:
8. unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad:
9. ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu.
10. Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:
11. ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:
12. ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu.
13. Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu:
14. n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha;
15. ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.
16. Jehova we gwa Moses okwu, si,
17. Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.
18. Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.
19. Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.
20. Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.
21. Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.
22. Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.
23. Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod:
24. nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan.
25. Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak.
26. Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan.
27. Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi.
28. Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud.
29. Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n'ala Kenean.