isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 23 Bible Nso (IGBOB)

1. Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.

2. Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

3. Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.

4. Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula.

5. Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

6. Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.

7. O we tua ilu-ya, si,N'Eram ka Belak nēsi dutem,Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si,Bia, buaram Jekob ọnu,Bia kwa, wesa Israel iwe.

8. Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi.Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.

9. N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.

10. Ònye gutaworo ájá Jekob,Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel?Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!

11. Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.

12. Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?

13. Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu.

14. Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

15. Ọ si Belak, Guzo onwe-gi n'ebe a n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma mu onwem gēzute Jehova n'ebe ahu.

16. Jehova we zute Belam, tiye okwu n'ọnu-ya, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

17. Ọ we biakute ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya na ndi-isi Moab. Belak we si ya, Gini ka Jehova kwuworo?

18. Ọ we tua ilu-ya, si,Bilie, Belak, nuru kwa;Ṅam nti, nwa Zipoa:

19. Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha;Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha:Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya?Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?

20. Le, ọ bu igọzi ka m'nataworo iwu:Ọ gọziwo kwa, apughkwam itughari ya.

21. O legideghi ajọ ihe anya nime Jekob,Ọ hughi kwa nmeb͕u n'Israel:Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya,Iti-nkpu nke eze di kwa n'etiti ha.

22. Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta;Ume dika ume atu ka ọ nwere

23. N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob,Iju-ase adighi kwa megide Israel:Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si,Le ihe Chineke meworo!

24. Le, ndi ahu nēbili dika nne-ọdum,Dika ọdum ka ọ nēweli onwe-ya:Ọ gaghi-edina rue mb͕e ọ gēri ihe ọ dọb͕utara,Ṅu kwa ọbara nke ndi eb͕uru eb͕u.

25. Belak we si Belam, Akọcha-kwa-la ha ma-ọli agọzi-kwa-la ha ma-ọli.

26. Belam we za, si Belak, Àgwaghm i, si, Ihe nile nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēme?

27. Belak we si Belam, Biko, bia, m'gēkuru gi je ebe ọzọ; eleghi anya ọ gēzi ezi n'anya Chineke ka i si n'ebe ahu kọcharam ha.

28. Belak we kuru Belam je n'elu Peoa, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.

29. Belam we si Belak, Wuerem ebe-ichu-àjà asa n'ebe a, dozi-kwa-ram oke-ehi asa na ebulu asa n'ebe a.

30. Belak we me dika Belam siri, ọ we sure otù oke-ehi na otù ebulu n'ebe-ichu-aja ọ bula.