isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 9 Bible Nso (IGBOB)

1. Abimelek nwa Jerubeal we jerue Shekem, jekuru umu-nne nne-ya, gwa ha okwu, gwa kwa ab͕uru nile nke ulo nna nne-ya, si,

2. Biko, kwuenu na nti ndi nile nwe Shekem, si, Òle nke diri unu nma? na ọgu ndikom atọ na iri, bú umu-ndikom nile nke Jerubeal, nāchi unu, ma-ọbu na otù nwoke nāchi unu? cheta-kwa-unu na ọkpukpu-unu na anu-aru-unu ka m'bu.

3. Ume-nne nne-ya kwue okwu ndia nile bayere ya na nti ndi nile nwe Shekem: obi-ha we wezuga onwe-ha iso Abimelek; n'ihi na ha siri, Nwa-nne-ayi ka ọ bu.

4. Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya.

5. O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.

6. Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem.

7. Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n'elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti.

8. Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi.

9. Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile?

10. Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

11. Osisi fig we si ha, M'gagha utọm na ezi ihe-ọmimim, je ifeghari n'elu osisi nile?

12. Osisi nile we si osisi vine, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

13. Osisi vine we si ha, M'gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n'elu osisi nile?

14. Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.

15. Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon.

16. Ma ub͕u a, ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo ihe a, na unu emewo Abimelek eze, ọ buru kwa na ọ bu ezi ihe ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ọ buru kwa na ọ bu dika nmeso aka-ya abua si di ka unu meworo ya;

17. (n'ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n'iru ya, we naputa unu n'aka Midian:

18. ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;)

19. ma ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n'Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya:

20. ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n'Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n'ulo Milo puta, ripia Abimelek.

21. Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n'ebe ahu, n'ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya.

22. Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ.

23. Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek:

24. ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya.

25. Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n'elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n'uzọ ahu n'akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek.

26. Geal nwa Ebed we bia, ya na umu-nne-ya, ha we gabiga ba Shekem: ndi-nwe Shekem we tukwasi ya obi.

27. Ha we pua ba n'ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n'ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek.

28. Geal nwa Ebed we si, Ònye bu Abimelek, ònye bu kwa Shekem, na ayi gēfè ya òfùfè? ọ̀ bughi nwa Jerubeal? Zebul kwa, ọ̀ bughi onye-nlekọta ihe-ya? fènu ndikom Hemoa, bú nna Shekem, òfùfè: ma gini mere ayi onwe-ayi nēfè ya òfùfè?

29. Ma ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nka nọ n'akam! m'gēwezuga kwa Abimelek. O we si Abimelek, Me ka usu-ndi-agha-gi ba uba, gi puta kwa.

30. Zebul, bú onye-isi obodo ahu, we nu okwu nile nke Geal nwa Ebed, iwe-ya we di ọku.

31. O we zigara Abimelek ndi-ozi n'aghughọ, si, Le, Geal nwa Ebed na umu-nne-ya nābà nime Shekem; ma, le, ha nākpab͕u obodo a imegide gi.

32. Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia:

33. ọ gēru kwa, n'ututu, mb͕e anyanwu nāwa, na i gēbili n'isi-ututu, made imegide obodo: ma, le, mb͕e ya onwe-ya na ndi ya na ha nọ nāpukute gi, i gēme kwa ha dika aka-gi gāchọta.

34. Abimelek we bilie n'abali, ya na ndi nile ndi soro ya, ha we rue nbì megide Shekem n'usu anọ.

35. Geal nwa Ebed we pua, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: Abimelek we si n'oruru-nbì ahu bilie, ya na ndi soro ya.

36. Geal we hu ndi ahu, we si Zebul, Le, ndi ufọdu si n'elu ugwu nārida. Zebul we si ya, Ọ bu onyinyo ugwu ka gi onwe-gi nāhu dika ndikom.

37. Geal we kwu ọzọ, si, Le, ndi ufọdu si n'elu-ala nke ala nārida, otù usu si kwa n'uzọ osisi terebinth nke Meonenim nābia.

38. Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha.

39. Geal we pua ga n'iru ndi-nwe Shekem, buso Abimelek agha.

40. Abimelek we chua ya, ọ we b͕alaga n'iru ya, ọtutu madu we da meru aru, rue oghere ọnu-uzọ-ama.

41. Abimelek we nọdu n'Aruma: Zebul we chupu Geal na umu-nne-ya, ka ha we ghara ibiri na Shekem.

42. O rue n'echi-ya, na ndi ahu puru ba n'ọhia; ha we gosi Abimelek.

43. O we chiri ndi-ya, kè ha usu atọ, rue nbì n'ọhia; ọ hu, ma, le, ndi ahu si n'obodo ahu nāputa; o we bilie imegide ha, tib͕ue ha.

44. Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n'ọhia, tib͕ue ha.

45. Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú.

46. Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n'ulo kachasi elu nke ulo El-berit.

47. Ewe gosi Abimelek na ndi nile nwe ulo-elu Shekem achikọtawo onwe-ha.

48. Abimelek we rigo n'ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n'aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n'ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m'mere, menu ngwa, menu dika m'meworo.

49. Ndi ahu nile we b͕utu kwa, nwoke ọ bula alaka-ya, ha we jeso Abimelek, tukwasi ha n'ulo ahu kachasi elu, su ulo kachasi elu ahu ọku n'isi ha; ndikom nile nke ulo-elu Shekem we nwu kwa, bú ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom abua na ọgu iri.

50. Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya.

51. Ma otù ulo-elu siri ike di n'etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n'ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n'elu ulo-elu ahu.

52. Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya.

53. Otù nwayi we tua aka-nkume n'isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya.

54. O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.

55. Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n'ebe nke ya.

56. Chineke we nyeghachi ihe ọjọ Abimelek, nke o mere nna-ya, n'ib͕u ọgu umu-nne-ya atọ na iri:

57. ọ bu kwa ihe ọjọ nile nke ndikom Shekem ka Chineke nyeghachiri n'isi-ha: nkọcha Jotam nwa Jerubeal we biakwasi ha.