isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 1 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?

2. Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.

3. Juda we si Simeon, bú nwa-nne-ya, Sorom rigo n'ala-ife-nzàm, ka ayi we buso ndi Kenean agha; mu onwem gēsoro kwa gi je n'ala-ife-nzà-gi. Simeon we soro ya je.

4. Juda we rigo; Jehova we nye ndi Kenean na ndi-Perizait n'aka-ha: ha we tib͕ue ha nime Bezek, orú nnù ndikom na nnù ise.

5. Ha we hu Adoni-bezek nime Bezek: ha we buso ya agha, tib͕ue ndi Kenean na ndi-Perizait.

6. Ma Adoni-bezek b͕alagara; ha we chua ya n'azu, jide ya, bipu isi-aka-ya abua na isi-ukwu-ya abua.

7. Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.

8. Umu Juda we buso Jerusalem agha, were ya, were ọnu nma-agha tib͕ue ya, su obodo ahu ọku.

9. Emesia umu Juda ridara ibuso ndi Kenean agha, bú ndi bi n'ugwu, na nime Negeb, na n'ebe di ala ala.

10. Juda we jekuru ndi Kenean ndi bi na Hebron: (ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba:) na tib͕ue Sheshai, na Ahiman, na Talmai.

11. O si n'ebe ahu jekuru ndi bi na Debia. (Ma aha Debia na mb͕e ara aga bu Kiriat-sefa.)

12. Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.

13. Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.

14. O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa we si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?

15. Ọ si ya, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb a ka i nyeworom, gi nyekwam isi miri ufọdu. Keleb we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.

16. Umu onye-Kinait, bú nna nwunye Moses, we si n'obodo nkwu soro umu Juda rigo n'ọzara Juda, nke di na Ndida nke Arad, ha we je biri n'etiti ndi ahu.

17. Juda we je, ya na Simeon, bú nwa-nne-ya, tib͕ue ndi Kenean ndi bi na Zefat, we wezuga ya ka ebibie ya. Ewe kpọ aha obodo ahu Họma.

18. Juda were kwa Geza na ókè-ala-ya, na Ashkelon na ókè-ala-ya, na Ekron na ókè-ala-ya.

19. Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.

20. Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.

21. Ma umu Benjamin anapughi ndi Jebus ndi bi na Jerusalem ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Benjamin nime Jerusalem, rue ta.

22. Ma ulo Josef, ha onwe-ha rigoru-kwa-ra Bet-el: Jehova we nọyere ha.

23. Ulo Josef we ziga iledo Bet-el. (Ma aha obodo ahu na mb͕e gara aga bu Luz.)

24. Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n'obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere.

25. Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile.

26. Nwoke ahu we je ala ndi Het, wue obodo, kpọ aha-ya Luz: nke ahu bu aha-ya rue ta.

27. Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.

28. O rue, mb͕e Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.

29. Efraim anapughi kwa ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha; ndi Kenean we biri na Gezea n'etiti ha.

30. Zebulun anapughi ndi bi na Kitron, na ndi bi na Nahalol, ala-ha; ndi Kenean we biri n'etiti ha, ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè.

31. Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha:

32. ndi Asha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi n'ala ahu: n'ihi na ha anapughi ha ala-ha.

33. Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n'ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè.

34. Ndi-Amorait we kpagide umu Dan n'ugwu: n'ihi na ha ekweghi ka ha rida na ndagwurugwu:

35. ma ndi-Amorait jisiri ike ibiri n'ugwu Heres, na n'Ajalon, na nime Shaalbim: ma aka ulo Josef dikariri arọ́, ha we ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè.

36. Ókè-ala ndi-Amorait we site na nrigo Akrabim, site na ukume di elu ahu, we rigo.