isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 11 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Jefta, bú onye Gilead, bu dike nke bu dìnkpà, ma ya onwe-ya bu nwa nwayi nākwa iko: ma Gilead muru Jefta.

2. Nwunye Gilead we muara ya umu-ndikom; nwunye-ya we tolite, chupu Jefta, si ya, I gaghi-eketa ihe n'ulo nna-ayi; n'ihi na nwa nwayi ọzọ ka i bu.

3. Jefta we b͕apu n'iru umu-nne-ya, biri n'ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n'ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua.

4. O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha.

5. O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n'ala Tob:

6. ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha.

7. Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n'ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u?

8. Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N'ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead.

9. Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ọ buru na unu eme ka m'lata ibuso umu Amon agha, ọ buru kwa na Jehova arara ha nye n'irum, mù onwem gāghọrọ unu onye-isi?

10. Ndi - okenye Gilead we si Jefta, Jehova bu onye nānu okwu a n'etiti ayi, ma ọ buru na ayi emeghi otú a, dika okwu-gi nile si di.

11. Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n'iru Jehova nime Mizpa.

12. Jefta we ziè ndi-ozi jekuru eze umu Amon, si, Gini ka mu na gi nwekọrọ, na i biakutewom ibuso alam agha?

13. Eze umu Amon we si ndi-ozi Jefta, N'ihi na Israel were alam, mb͕e o si n'Ijipt rigota, site n'Anon we rue Jabok, ru kwa Jọdan: ma ub͕u a nyeghachi ala ahu nile n'udo.

14. Jefta we zì kwa ndi-ozi jekuru eze umu Amon ọzọ:

15. ọ si ya, Otú a ka Jefta siri, Israel eweghi ala Moab ma-ọbu ala umu Amon:

16. n'ihi na mb͕e ha siri n'Ijipt rigota, Israel we je ije n'ọzara rue Oké Osimiri Uhie, biarue Kedesh;

17. Israel we zìe ndi-ozi jekuru eze Edom, si, Biko, ka m'gabiga nime ala-gi: ma eze Edom egeghi nti. Ọzọ kwa, o ziri ndi-ozi jekuru eze Moab: ma ọ kwegh: Israel we nọdu na Kedesh.

18. O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab.

19. Israel we zìe ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, bú eze Heshbon; Israel we si ya, Biko, ka ayi gabiga nime ala-gi rue ebe nkem.

20. Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha.

21. Jehova, bú Chineke Israel, we nye Saihon na ndi-ya nile n'aka Israel, ha we tib͕ue ha: Israel we nweta ala nile nke ndi-Amorait, bú ndi bi n'ala ahu.

22. Ha we nweta ókè-ala nile nke ndi-Amorait, site n'Anon we rue Jabok, site kwa n'ọzara we rue Jọdan.

23. Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke Israel, anapuwo ndi-Amorait ala-ha n'iru ndi-Ya, bú Israel, ọ̀ bu kwa gi onwe-gi gēnweta ha?

24. Ọ̀ bughi ihe Kemosh, bú chi-gi, nēme gi ka i nweta, ka i gēnweta? Ma onye ọ bula Jehova, bú Chineke - ayi, napuworo ala-ya n'iru ayi, nke ahu ka ayi gēnweta.

25. Ma ub͕u a, gi onwe-gi, ì di nma ma-ọli kari Belak nwa Zipoa, bú eze Moab? ọ̀ chọrọ Israel okwu ma-ọli? ma-ọbu ò busoro ha agha ma-ọli?

26. Mb͕e Israel biri na Heshbon na n'umu-obodo-ya, na n'Aroea na n'umu-obodo-ya, na n'obodo nile nke di n'akuku Anon, ọgu arọ iri-na-ise; gini mere unu anaputaghi kwa ha n'aka-ha na mb͕e ahu?

27. Mu onwem emehieghi kwa megide gi, ma gi onwe-gi nēmem ihe ọjọ n'ibusom agha: Jehova, bú Onye-ikpe, gēkpe ikpe ta n'etiti umu Israel na umu Amon.

28. Ma eze umu Amon egeghi nti okwu nile nke Jefta nke o zitere ya.

29. Mọ nke Jehova we dikwasi Jefta, o we gabiga Gilead na Manase, gabiga kwa Mizpa Gilead, si na Mizpa nke Gilead gabiga rue umu Amon.

30. Jefta we kwe Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye umu Amon n'akam n'ezie,

31. o gēru kwa, na ihe ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulom puta izutem, mb͕e m'siri n'umu Amon lata n'udo, Jehova gēnwe ya, m'gēsure kwa ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku.

32. Jefta we gabiga rue umu Amon ibuso ha agha; Jehova we nye ha n'aka-ya.

33. Ọ we tib͕ue ha oké ntib͕u uku site n'Aroea we rue ebe i si ba Minit, bú orú obodo, ru kwa Ebel-Keramim. Ewe me ka umu Amon ruru ala n'iru umu Israel.

34. Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya.

35. O rue, mb͕e ọ huru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ewó, adam! i mewo ka m'ruru ala nke-uku, gi onwe-gi adiwo kwa n'etiti ndi nēmekpam aru: ma mu onwem, asaghepuworom Jehova ọnum, apughkwam ilaghachi azu.

36. Ọ si ya, Nnam, i saghepuworo Jehova ọnu-gi; mem dika ihe ahu si di nke siworo n'ọnu-gi puta; ebe Jehova bọworo gi ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-gi, bú n'aru umu Amon.

37. O we si nna-ya, Ka emem ihe a: ram aka ọnwa abua, ka m'we je rida rue n'elu ugwu, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke m'nọ, mu onwem na umu-ab͕ọghọ-ibem.

38. Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n'elu ugwu.

39. O rue, n'ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n'Israel,

40. na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.