isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 20 Bible Nso (IGBOB)

1. Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.

2. Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha.

3. (Ma umu Benjamin nuru na umu Israel arigowo rue Mizpa.) Umu Israel we si, Kwuenu, ìhe ọjọ a si aṅa di?

4. Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m'biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali.

5. Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua.

6. M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel.

7. Le, unu nile, bú umu Israel, weputanu okwu na ìzù n'onwe-unu n'ebe a.

8. Ndi Israel nile we bilie dika otù nwoke, si, Ayi agaghi-eje, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ayi agaghi-ewezuga kwa onwe-ayi, onye ọ bula ibà n'ulo-ya.

9. Ma ub͕u a nka bu ihe ayi gēme Gibea; ayi gārigo imegide ya n'ofufe-nzà;

10. ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel.

11. Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n'otù.

12. Ebo Israel nile we zisa ndikom n'ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n'etiti unu?

13. Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel.

14. Umu Benjamin we si n'obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha.

15. Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.

16. N'etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie.

17. Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.

18. Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.

19. Umu Israel we bilie n'ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea.

20. Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n'usoro megide ha na Gibea.

21. Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n'etiti Israel n'ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

22. Ndi ahu, bú ndikom Israel, we me onwe-ha ka ha di ike, ha we do kwa agha n'usoro ọzọ n'ebe ha doro onwe-ha n'usoro n'ubọchi mbu.

23. (Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)

24. Umu Israel we biarue nso imegide umu Benjamin n'ubọchi nke-abua.

25. Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha.

26. Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.

27. Umu Israel we jua Jehova ase, (n'ihi na n'ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu,

28. Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.

29. Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.

30. Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n'ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n'usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga.

31. Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n'obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n'uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n'ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel.

32. Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n'iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n'obodo dọputa ha n'uzọ atuliri atuli.

33. Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba.

34. Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru.

35. Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.

36. Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea.

37. Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile.

38. Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n'obodo ahu rigo.

39. Ndikom Israel we chigharia n'agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n'ihi na ha siri, N'ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n'iru ayi ka ha bu, dika n'agha mbu.

40. Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe.

41. Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru.

42. Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha.

43. Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu.

44. Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

45. Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise.

46. Ndi nile ndi si na Benjamin da n'ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà.

47. Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ.

48. Ndikom Israel we laghachikuru umu Benjamin, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, site n'obodo ndikom rue anu-ulo na ihe ọ bula nke achọtara achọta; ọzọ kwa, obodo nile nke ha chọtara, ha suru ha ọku.