Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 8:22-30 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.

23. O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya.

24. Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu.

25. Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya:

26. o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n'abuba ahu na n'utaku-ukwu aka-nri:

27. o tiye ha nile n'elu ọbu-aka abua nke Eron, na n'elu ọbu-aka nke umu-ya ndikom, we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.

28. Moses we wepu ha n'elu ọbu-aka-ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu: nmeju-aka ka ha bu, ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

29. Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu.

30. Moses were kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu, na ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya; ọ we do Eron nsọ, do kwa uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom, nsọ tiyere ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 8