isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 9 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke we gọzie Noa na umu-ya ndikom, si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa.

2. Egwù-unu na ujọ-unu gādikwasi n'anu nile ọ bula nke uwa nke di ndu, na n'anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; tiyere ihe nile ọ bula nke ala nēnuputa, tiye-kwa-ra azù nile nke oké osimiri, n'aka-unu ka enyeworo ha.

3. Ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, nke di ndu, gāburu unu ihe-oriri; dika akwukwọ ihe-ọkukú ka M'nyeworo unu ha nile.

4. Nání anu-aru nke ndu-ya, bú ọbara-ya, di nime ya ka unu nāgaghi-eri.

5. N'ezie ọbara-unu, bú nke diri ndu-unu, ka M'gajuta kwa; n'aka anu nile ọ bula di ndu ka M'gājuta ya: ọ bu kwa n'aka madu, n'aka nwa-nne madu ọ bula, ka M'gājuta ndu madu.

6. Onye nāwusi ọbara madu, site n'aka madu ka agāwusi ọbara-ya: n'ihi na ọ bu n'onyinyo Chineke ka O mere madu.

7. Unu onwe-unu kwa, muanu ọmùmù, banu uba; nuputanu umu n'uwa, ba uba nime ya.

8. Chineke we gwa Noa, gwa kwa umu-ya ndikom tiyere ya, okwu, si,

9. Mu onwem kwa, le, M'ganēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ, na n'ebe nkpuru-unu nọ, bú ndi gānọchi unu;

10. na n'ebe anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu di nke dinyere unu, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia nile ọ bula nke uwa nke dinyere unu; bú nke sitere n'ihe nile nēsi n'ub͕ọ ahu puta, bú anu-ọhia nile ọ bula nke uwa.

11. M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.

12. Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n'etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi:

13. eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa.

14. Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu,

15. M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.

16. Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n'igwe-oji; M'gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n'etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n'elu uwa.

17. Chineke we si Noa, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọbub͕a-ndu ahu nke M'meworo ka o guzosie ike n'etiti Mu na anu-aru nile nke di n'elu uwa.

18. Umu-ndikom Noa, ndi siri n'ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean.

19. Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.

20. Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine:

21. ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya.

22. Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n'èzí.

23. Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha.

24. Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya.

25. Ọ we si,Onye anābu ọnu ka Kenean bu;Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom.

26. Ọ si kwa,Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu;Ka Kenean ghọkwara ha orù.

27. Ka Chineke me ka Jefet setia,Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem;Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù.

28. Noa we di ndu, mb͕e iju-miri ahu gasiri, ọgu arọ iri-na-asa na arọ iri.