isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 16 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega.

2. Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n'olu Serai.

3. Serai, bú nwunye Abram, we were Hega, bú onye Ijipt, bú nwayi nējere ya ozi, nye Abram, bú di-ya, na nwunye, n'ọgwugwu arọ nke-iri Abram biri n'ala Kenean.

4. O we bakuru Hega, o we turu ime: o we hu na ọ turu ime, ewe leda nwayi-nwe-ya n'anya-ya.

5. Serai we si Abram, Ihe-ikem di n'aru gi: mu onwem nyere nwayi nējerem ozi n'obi-gi; o we hu na ọ turu ime, ewe ledam n'anya-ya: ka Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi.

6. Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n'aka-gi; me ya ihe di nma n'anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n'iru-ya.

7. Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua.

8. Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu.

9. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, Laghachikuru nwayi-nwe-gi, weda kwa onwe-gi ala n'okpuru aka-ya.

10. Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M'gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n'ihi ọtutu ọ di.

11. Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.

12. Ya onwe-ya gābu kwa madu yiri inyinya-ibu-ọhia; aka-ya gēmegide madu nile ọ bula, aka madu nile ọ bula gēmegide kwa ya; ọ bu kwa n'iru umu-nne-ya nile ka o gēbi.

13. Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya?

14. N'ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n'etiti Kedesh na Bered.

15. Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael.

16. Abram b͕ara ọgu arọ anọ na isi, mb͕e Hega muru Ishmael nye Abram.