isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42
  43. 43
  44. 44
  45. 45
  46. 46
  47. 47
  48. 48
  49. 49
  50. 50

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jenesis 33 Bible Nso (IGBOB)

1. Jekob we welie anya-ya abua, hu, ma le, Isọ nābia, ya na nnù ndikom. Ọ we ke umu-ya nye Lia, nye kwa Rechel, nye kwa ndinyom abua ahu nēje ozi.

2. Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha.

3. Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso.

4. Isọ we b͕a ọsọ izute ya, b͕akua ya, dakwasi ya n'olu, sutu ya ọnu: ha we kwa ákwá.

5. Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara.

6. Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala.

7. Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala.

8. Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m'zutere, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n'iru onye-nwem.

9. Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere.

10. Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.

11. Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.

12. Ọ si, Ka ayi bulie ije, ka ayi la, ka m'je kwa n'iru gi.

13. Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n'akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa,

14. Biko, ka onye-nwem gabiga n'iru orù-ya: ma mu onwem, ka m'nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n'irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m'gābiakute onye-nwem rue Sia.

15. Isọ we si, Biko, ka m'chiri madu ufọdu nime ndi mu na ha yikọrọ bia, debe n'ebe i nọ. Ọ si, N'ìhi gini kwa? ka m'huta amara n'iru onye-nwem.

16. Isọ we laghachi ubọchi ahu n'uzọ-ya ije Sia.

17. Jekob we bulie ije rue Sukot, wuere onwe-ya ulo, ma-kwa-ra anu-ulo-ya ulo-ntu: n'ihi nka akpọrọ aha ebe ahu Sukot.

18. Jekob we biarue Shelem, bú obodo Shekem, nke di n'ala Kenean, mb͕e o siri na Padan-eram bia; ọ ma ulo-ikwū-ya n'iru obodo ahu.

19. O we zuta òkè ọhia ahu, ebe ọ b͕asara ulo-ikwū-ya, n'aka umu Hemoa, bú nna Shekem, n'ọgu nkpuru-ego ise.

20. O guzo ebe-ichu-àjà ọtọ n'ebe, ahu, kpọ ya, El-elohe-Israel.